1 Samuel 20

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NTLH

Sair da comparação
NTLH Nova Tradução na Linguagem de Hoje 2000
1 Devid sitere na Naịọt nʼime Rema gbapụ ọsọ, chọta Jonatan, sị ya, “Ọ bụ gịnị ka m mere? Gịnị bụkwa ihe ọjọọ m mere? Olee ụzọ m si mejọọ nna gị, mere o ji na-achọsi ike ka ọ napụ m ndụ m?”
1 Então Davi fugiu da casa dos profetas , em Ramá, foi até o lugar onde Jônatas estava e disse: — O que foi que eu fiz? Qual foi o meu crime? Que mal fiz eu ao seu pai, para ele querer me matar?
2 Jonatan sịrị ya, “Nke a abụghị eziokwu. Ị gaghị anwụ! Ihe dị otu a adịghị nna m nʼobi, nʼihi na ọ na-agwa m ihe ọbụla ọ na-ezube ime, ọ bụladị ihe ukwu maọbụ ihe ntakịrị. Amakwaara m na ọ gaghị ezonarị m ihe dị otu a. Mba, ọ bụghị eziokwu.”
2 Jônatas respondeu: — Que Deus não permita que você morra! O meu pai me conta tudo o que faz, seja importante ou não. Ele não esconderia isso de mim. Isso não é bem assim!
3 Devid ṅụrụ iyi sị, “Nna gị maara nke ọma na m anatala amara nʼebe ị nọ, nʼihi ya, o kwuola nʼime onwe ya sị, ‘Agaghị m agwa Jonatan, ka ọ ghara iwute ya.’ Ma eji m Onyenwe anyị na mkpụrụobi gị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụ naanị otu nzọ ụkwụ dị ugbu a nʼetiti mụ na ọnwụ.”
3 Mas Davi respondeu: — O seu pai sabe muito bem o quanto você gosta de mim. Por isso, resolveu não deixar que você fique sabendo dos planos dele, para você não sofrer muito. Eu juro pela sua vida e pela vida de Deus, o
4 Jonatan sịrị Devid, “Ihe ọbụla ị chọrọ ka m mee, aga m emere gị ya.”
4 — O que você quer que eu faça? — perguntou Jônatas.
5 Devid sịrị ya, “Lee echi ga-abụ mmemme ọnwa ọhụrụ, e kwesiri m iso eze rie nri. Ma hapụ m ka m ga zoo onwe m nʼọhịa tutu ruo uhuruchi nke nwanne echi.
5 Davi respondeu: — Amanhã é a
6 Ọ bụrụ na nna gị ajụọ ase m, sị ya, ‘Devid rịọsiri m arịrịọ ike ka m hapụ ya ka ọ gbaga Betlehem, bụ obodo ya, nʼihi a na-achụ aja nke dịrị agbụrụ ya kwa afọ.’
6 Se o seu pai notar que eu não estou à mesa, diga que eu pedi a você para me deixar ir com urgência a Belém, pois está na época de toda a minha família oferecer lá o sacrifício anual.
7 Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ọ dị mma,’ mgbe ahụ, udo ga-adịrị ohu gị. Ma ọ bụrụ na o wee iwe nke ukwuu, mara nʼezie na o zubere ime m ihe ọjọọ.
7 Se ele disser: “Está bem”, eu estarei salvo. Mas, se ele ficar com raiva, então você ficará sabendo que ele está com más intenções.
8 Ma gị onwe gị, meere ohu gị ebere, nʼihi na i meela ka o sooro gị baa nʼọgbụgba ndụ nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na ikpe mara m, gị onwe gị gbuo m. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji nyefee m nʼaka nna gị?”
8 Peço que você me faça este favor e cumpra assim a promessa sagrada que me fez. Porém, se eu sou culpado, mate-me você mesmo! Por que deixar o seu pai fazer isso?
9 Jonatan sịrị, “Agaghị m eme ya, lee, a sịkwa na m maara na nna m na-achọ igbu gị, ọ bụ na m agaghị agwa gị?”
9 — Nem pense numa coisa dessas! — respondeu Jônatas. — Se eu soubesse que o meu pai estava mesmo resolvido a acabar com você, acha que eu não o avisaria?
10 Devid jụrụ ya, “Onye ga-agwa m ma ọ bụrụ na nna gị aza gị okwu ike ike?”
10 Então Davi perguntou: — E, se o seu pai responder com raiva, quem vai me avisar?
11 Jonatan sịrị ya, “Bịa ka anyị pụọ gaa nʼọhịa.” Ya mere, ha abụọ pụrụ jee nʼọhịa.
11 Jônatas respondeu: — Venha comigo, vamos até o campo. Eles foram,
12 Jonatan gwara Devid sị, “Eji m aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwe nkwa na-asị gị, nʼoge ugbu a echi, maọbụ nwanne echi, aga m akpanyere nna m ụka banyere gị, meekwa ka ị mata ihe ọ na-eche banyere gị. Ọ bụrụ na obi dị ya mma nʼebe ị nọ, aga m eme ka ị mata.
12 e Jônatas disse a Davi: — Que o
13 Ma ọ bụrụ na nna m na-achọ imerụ gị ahụ, ka Onyenwe anyị mesoo Jonatan mmeso, otu ọbụla o si dị njọ, ma ọ bụrụ na m abịaghị gwa gị, zilaga gị ka ị laa nʼudo. Ka Onyenwe anyị nọnyere gị dịka o si nọnyere nna m.
13 Mas, se ele tiver a intenção de fazer alguma coisa contra você, que o Senhor Deus me mate se eu não enviar uma mensagem a você e não deixá-lo ir embora são e salvo! Que o Senhor esteja com você, assim como esteve com o meu pai!
14 Chetakwa, i ghaghị igosi m ịhụnanya na obi ebere Onyenwe anyị, ma ọ bụrụ na m anwụọ.
14 E agora, se eu continuar vivo, cumpra a sua promessa sagrada e seja fiel a mim. Mas, se eu morrer,
15 E wezugakwala ịhụnanya gị na obi ebere gị site nʼebe ezinaụlọ m dị, ọ bụladị mgbe Onyenwe anyị bipụchara ndị iro Devid niile site nʼelu ụwa.”
15 trate sempre a minha família com bondade. E, quando o Senhor destruir completamente todos os nossos inimigos,
16 Jonatan na ụlọ Devid gbara ndụ. O kwuru sị, “Ka Onyenwe anyị kpee ndị iro Devid niile ikpe.”
16 que nós não quebremos a promessa que fizemos um ao outro. Se você a quebrar, Deus o castigará.
17 Jonatan mere ka Devid site nʼịhụnanya ọ hụrụ ya ṅụọra ya iyi. Nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka ọ hụrụ onwe ya.
17 Novamente Jônatas fez um juramento de amizade a Davi, pois ele amava Davi como a si mesmo.
18 Mgbe ahụ, Jonatan sịrị Devid, “Echi bụ mmemme ọnwa ọhụrụ. A ga-ele anya gị, nʼihi na ọnọdụ gị ga-atọgbọrọ nʼefu.
18 E disse a Davi: — Amanhã é a Festa da Lua Nova, e, se você não estiver lá, a sua falta será notada.
19 Nwanne echi ya, nʼoge uhuruchi, gaa nʼebe ahụ i zoro onwe gị mgbe nsogbu a malitere, chere nʼebe ahụ, nʼakụkụ nkume Ezel.
19 Depois de amanhã a sua falta será notada ainda mais. Assim vá para o lugar onde você se escondeu da outra vez e fique atrás do monte de pedras que há ali.
20 Aga m abịa gbaa àkụ atọ nʼakụkụ ya dịka a ga-asị na o nwere ihe m chọrọ iji ụta m gbata.
20 Então eu atirarei três flechas, como se o monte de pedras fosse um alvo.
21 Emesịa, aga m ezipu otu nwantakịrị sị ya, ‘Gaa chọta àkụ ndị ahụ.’ Ọ bụrụ na ị nụ ka m na-agwa ya okwu sị, ‘Lee àkụ ndị a dị nʼakụkụ azụ gị, chita ha ebe a,’ mgbe ahụ, pụta nʼihi, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, udo dịrị gị, egwu ọbụla adịghị.
21 Aí direi ao meu empregado para ir buscá-las. Se eu disser a ele: “Olhe, as flechas estão para cá de você, pegue-as” — isso quer dizer que tudo está bem, e você pode sair. Eu juro por Deus, o Senhor , que nesse caso você não estará em perigo.
22 Ma ọ bụrụ na m agwa nwantakịrị ahụ okwu sị ya, ‘Lee, àkụ ahụ dị nʼihu gị,’ ọ pụtara na ị ghaghị isi nʼebe a pụọ, nʼihi na Onyenwe anyị ezipụla gị.
22 Mas, se disser a ele: “As flechas estão mais para lá de você” — então fuja, pois o Senhor estará mandando que você vá.
23 Ma ihe banyere okwu ahụ anyị kwuru, cheta na Onyenwe anyị bụ onye akaebe, nʼetiti mụ na gị ruo mgbe ebighị ebi.”
23 Quanto à promessa que fizemos um ao outro, o Senhor Deus nos ajudará a cumpri-la para sempre.
24 Ya mere, Devid gara zoo onwe ya nʼọhịa. Mgbe oge mmemme ọnwa ọhụrụ ruru, eze Sọl nọdụrụ ala iri nri.
24 Então Davi se escondeu no campo. O rei Saul chegou para a Festa da Lua Nova
25 Ọ nọdụrụ ọdụ nʼakụkụ aja ụlọ, bụ ebe ọ dị mbụ anọ, na ncherita ihu Jonatan. Abna nọdụrụ nʼakụkụ Sọl, ma oche Devid na-anọ enweghị onye nọ ya.
25 e sentou-se para comer no lugar de costume, perto da parede. Abner sentou-se ao lado de Saul, e Jônatas, na sua frente. Mas o lugar de Davi ficou vazio.
26 Sọl ekwughị ihe ọbụla banyere ya nʼụbọchị ahụ, nʼihi na o chere na ọ dị ihe ndaba mere, nke tinyere Devid nʼọnọdụ adịghị ọcha. Sọl kwuru nʼobi ya sị, “E, ọ ghaghị ịbụ ihe kpatara ya.”
26 Naquele dia Saul não disse nada porque pensou: “Deve ter acontecido alguma coisa com ele, e de certo ele não passou pela cerimônia de purificação .”
27 Ma nʼechi ya, bụ abalị nke abụọ nke ọnwa ọhụrụ, ọnọdụ Devid tọgbọrọ nʼefu ọzọ. Mgbe ahụ, Sọl sịrị nwa ya Jonatan, “Gịnị mere nwa Jesi abịaghị iso rie nri, ma ụnyaahụ ma taa?”
27 No dia seguinte, o segundo dia da Festa da Lua Nova, o lugar de Davi continuava desocupado. Aí Saul perguntou a Jônatas: — Por que Davi não veio comer nem ontem nem hoje?
28 Jonatan zara sị, “Devid rịọrọ sị m nye ya ike ka ọ gaa Betlehem.
28 Jônatas respondeu: — Ele me pediu licença para ir a Belém.
29 Ọ sịrị m, ‘Kwere ka m gaa nʼihi na ndị ezinaụlọ anyị nwere aja mmemme ha na-eme nʼobodo. Nwanne m nwoke nyere m iwu sị m na m aghaghị ịbịa. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼebe ị nọ, biko kwere ka m gaa hụ ụmụnne m.’ Ọ bụ nke a mere ọ bịaghị na tebul eze.”
29 Ele me disse: “Deixe-me ir a Belém porque a minha família está lá fazendo a festa do sacrifício, e o meu irmão mandou que eu também fosse. Se você é meu amigo, deixe que eu vá ver os meus parentes.” E Jônatas continuou: — É por isso que ele não está no seu lugar, à mesa.
30 Iwe were Sọl nke ukwuu. Ọ gwara Jonatan okwu nʼiwe sị ya, “Gị nwa nke nwanyị na-enupu isi, nke uche ya gbagọrọ agbagọ. Ị na-eche na m amaghị na i dịnyere nwa Jesi si otu a wetara onwe gị na nne gị ihe ihere?
30 Então Saul ficou muito zangado com Jônatas e disse: — Seu filho de uma mulher à toa! Agora eu sei que você passou para o lado de Davi, trazendo desonra para você e para a sua mãe!
31 Nʼihi na ụbọchị niile nwa Jesi dị ndụ nʼụwa a, ọnọdụ gị na alaeze gị agaghị eguzosi ike. Ugbu a, pụọ, zipụ ozi kpọtara m ya ka m gbuo ya!”
31 Enquanto Davi for vivo, você não será rei deste país. Vá agora e traga-o aqui porque é preciso que ele morra!
32 Jonatan jụrụ nna ya Sọl sị, “Gịnị ka o mere? Nʼihi gịnị ka a ga-eji mee ka ọ nwụọ?”
32 — Por que é que ele deve morrer? — perguntou Jônatas. — O que foi que ele fez?
33 Ma Sọl tụrụ ùbe o ji nʼaka ya ka o jiri ya tugbuo Jonatan, ma Jonatan zere ya. Nke a mere ka Jonatan mata nʼezie na nna ya na-achọ igbu Devid.
33 Então Saul atirou a sua lança contra Jônatas para matá-lo. E assim Jônatas compreendeu que o seu pai estava mesmo resolvido a matar Davi.
34 Jonatan si na tebul ahụ bilie nʼoke iwe pụọ, o righịkwa nri nʼụbọchị nke abụọ nke mmemme ahụ, nʼihi na omume ihere nna ya mesoro Devid wutere ya hie nne.
34 Jônatas levantou-se furioso da mesa e não comeu nada naquele dia, o segundo dia da Festa da Lua Nova. Ele estava muito sentido porque Saul tinha insultado Davi.
35 Nʼụtụtụ echi ya, dịka ha kara aka, Jonatan gara nʼọhịa, ya na nwantakịrị nwoke so gaa.
35 Na manhã seguinte ele foi ao campo a fim de encontrar Davi, como tinham combinado. Levou consigo um rapazinho
36 Ọ sịrị nwantakịrị nwoke ahụ, “Gbara ọsọ gaa chọta àkụ ndị ahụ niile m na-agba.” Mgbe nwantakịrị ahụ na-agba ọsọ na-aga, Jonatan gbapụrụ àkụ, gbafee ya nʼihu nwantakịrị ahụ.
36 e disse: — Corra e vá buscar as flechas que eu atirar. O rapaz correu, e Jônatas atirou uma flecha que passou além dele.
37 Mgbe nwokorobịa ahụ na-ejeru nso ebe àkụ ahụ Jonatan gbara dị, Jonatan kpọkuru ya sị ya, “Àkụ ahụ dị nʼihu gị.”
37 Quando o rapaz chegou ao lugar onde a flecha tinha caído, Jônatas gritou: — A flecha caiu mais para lá de você!
38 Mgbe ahụ, o tiri mkpu sị, “Mee ngwangwa! Gawa ọsịịsọ! Eguzokwala!” Nwokorobịa ahụ chịkọtara àkụ ndị ahụ niile gbaghachikwute nna ya ukwu.
38 Não fique aí parado! Ande logo! O rapaz pegou as flechas e voltou para perto do seu patrão,
39 Ma nwantakịrị nwoke ahụ aghọtaghị ihe Jonatan mere; ma Jonatan na Devid maara ihe gara.
39 não sabendo o que queria dizer tudo aquilo — somente Jônatas e Davi sabiam.
40 Jonatan nyere nwokorobịa ahụ ụta ya na àkụ ndị ahụ ka ọ chighachi ha nʼobodo.
40 Aí Jônatas entregou as suas armas ao rapaz e mandou que as levasse de volta para a cidade.
41 Mgbe nwokorobịa ahụ lara, Devid biliri site nʼakụkụ ndịda nkume ahụ ebe o zoro onwe kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala ugboro atọ, nʼihu Jonatan. Ha suritere onwe ha ọnụ, bekọkwaa akwa. Ma Devid kwara akwa karịa.
41 Depois que o rapaz foi embora, Davi saiu de trás do monte de pedras, jogou-se no chão e encostou o rosto na terra três vezes. Então eles se beijaram chorando. E a tristeza de Davi era maior do que a de Jônatas.
42 Nʼikpeazụ, Jonatan gwara Devid okwu sị, “Gaa nʼudo, nʼihi na anyị ejirila aha Onyenwe anyị ṅụọ iyi ịbụ enyi nʼetiti onwe anyị, na-asị, ‘Onyenwe anyị bụ onye akaebe nʼebe mụ na gị, na nʼebe ụmụ ụmụ m, na ụmụ ụmụ gị nọ ruo mgbe ebighị ebi.’ ” Ha kewara. Devid malitere ịpụ, ma Jonatan tụgharịrị baa nʼobodo.
42 Aí Jônatas disse a Davi: — Deus esteja com você! O Então Davi partiu, e Jônatas voltou para a cidade.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Samuel 20, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.