1 Samuel 17
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVT
1 Nʼoge a, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha ọnụ, zukọtaa nʼobodo Sokoh nke dị na Juda maka ibu agha. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼEfes Damim, nke dị nʼagbata Sokoh na Azeka.
1 Os filisteus reuniram seu exército para a batalha e acamparam em Efes-Damim, entre Socó, em Judá, e Azeca.
2 Mgbe ahụ, Sọl na ndị Izrel niile zukọtara maa ụlọ ikwu nke ha na ndagwurugwu Ịla. Ha doro onwe ha nʼusoro agha izute ndị Filistia.
2 Em resposta, Saul reuniu as tropas israelitas perto do vale de Elá.
3 Ndị Filistia doro onwe ha nʼelu ugwu nʼotu akụkụ, ma ndị Izrel dokwara onwe ha nʼelu ugwu nʼakụkụ nke ọzọ. Ndagwurugwu dịkwa nʼetiti ha.
3 Assim, os filisteus e os israelitas ficaram frente a frente, em colinas opostas, com o vale entre eles.
4 Mgbe ahụ, otu onye ọka agha aha ya bụ Golaịat, onye obodo Gat, sitere nʼetiti ụlọ ikwu ndị Filistia pụta. Nwoke a toro ogologo nke ukwuu; ịdị ogologo ya ga-erukwa mita atọ.
4 Então Golias, um guerreiro filisteu de Gate, saiu das fileiras do exército filisteu. Ele tinha 2,90 metros de altura,
5 O kpu okpu agha e ji bronz kpụọ, ma yiri uwe agha nke ịdị arọ bronz e ji kpụọ ya ga-erukwa iri kilogram ise na asaa.
5 usava um capacete de bronze e vestia uma couraça de escamas de bronze que pesava sessenta quilos.
6 O yikwa ihe agha o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ nke e ji bronz kpụọ, nyakwasịkwa nʼubu ya ùbe e ji bronz kpụọ.
6 Também usava caneleiras de bronze e carregava no ombro um dardo de bronze.
7 A kpụrụ ùbe ya ka ọ dịrị ka osisi e ji ekwe akwa, jiri igwe ịdị arọ ya ga-eru kilogram asaa kpụọ ọnụ ọnụ ùbe ahụ. Onye na-ebu ọta o ji ekpuchi obi ya nọkwa nʼihu ya.
7 A haste de sua lança era pesada e grossa, como o eixo de um tear, e a ponta de ferro da lança pesava cerca de sete quilos. Seu escudeiro caminhava à frente dele.
8 Golaịat guzoro kpọkuo ndị agha Izrel sị ha, “Gịnị mere unu ga-eji pụta guzo nʼusoro ibu agha. Ọ bụ na m abụghị onye Filistia? Ọ bụkwa na unu onwe unu abụghị ndị ozi Sọl? Họpụtaranụ onwe unu otu nwoke, ka ọ bịakwute m.
8 Golias parou e gritou para as tropas israelitas: “Por que saíram todos para lutar? Eu sou filisteu, e vocês são servos de Saul. Escolham um homem para vir aqui e lutar comigo!
9 Ọ bụrụ na onye ahụ unu họpụtara etigbuo m, anyị ga-abụrụ unu ndị ohu, ma ọ bụrụkwanụ na m etigbuo ya, unu ga-abụrụ anyị ndị ohu!”
9 Se ele me matar, seremos seus escravos. Mas, se eu o matar, vocês serão nossos escravos!
10 Mgbe ahụ, onye Filistia ahụ sịrị, “Taa, ana m ama usuu ndị agha Izrel aka nʼihu! Kpọpụtaranụ m otu nwoke ka mụ na ya lụọ ọgụ.”
10 Desafio hoje os exércitos de Israel. Mandem um homem para lutar comigo!”.
11 Mgbe Sọl na ndị agha Izrel nụrụ ihe onye Filistia a kwuru, ha mara jijiji tụọkwa oke egwu.
11 Quando Saul e os israelitas ouviram isso, ficaram aterrorizados e muito abalados.
12 Ma Devid bụ nwa Jesi, onye Efrat nke Betlehem dị na Juda. Jesi mụtara ndị ikom asatọ. Nʼoge nke Sọl, ọ ghọọla agadi nwoke.
12 Davi era filho de Jessé, efrateu de Belém, na terra de Judá. Na época do rei Saul, Jessé já era idoso e tinha oito filhos.
13 Atọ nʼime ụmụ ndị ikom Jesi, ndị bụ okenye, soro Sọl gaa agha. Aha ha bụ Eliab, ọkpara ya, Abinadab, nwa nke abụọ na Shama, nwa nke atọ.
13 Os três filhos mais velhos de Jessé — Eliabe, Abinadabe e Simeia — haviam se alistado no exército de Saul para lutar contra os filisteus.
14 Devid bụ ọdụdụ nwa. Ụmụnne ya ndị okenye atọ na-eso Sọl.
14 Davi era o mais novo. Seus três irmãos mais velhos seguiam o exército de Saul,
15 Ma Devid na-apụ jekwuru Sọl, ma na-alaghachikwa nʼụlọ ịzụ atụrụ nna ya na Betlehem.
15 enquanto Davi ia e voltava para ajudar seu pai a cuidar das ovelhas em Belém.
16 Golaịat, onye Filistia na-abịaru nso ụtụtụ na uhuruchi, na-eguzo onwe ya otu a iri ụbọchị anọ.
16 Durante quarenta dias, pela manhã e à tarde, o guerreiro filisteu se apresentava diante do exército israelita e o desafiava.
17 Otu ụbọchị, Jesi gwara Devid okwu sị, “Bịa ka i wegara ụmụnne gị otu akpa ọka ndị a e ghere eghe. Chịrịkwa ogbe achịcha iri ndị a chịlara ha.
17 Um dia, Jessé disse a Davi: “Leve depressa para seus irmãos que estão no acampamento este cesto com grãos tostados e estes dez pães.
18 Wegakwara onyeisi usuu ha, iri chiizi, ndị a. Chọpụta otu ihe si agara ụmụnne gị natakwa ha ihe ị ga-egosi anyị na ha dị ndụ.”
18 Leve também estes dez queijos para o capitão deles. Veja como estão seus irmãos e traga notícias deles”.
19 Ha na Sọl na ndị ikom Izrel niile, nọ na ndagwurugwu Ịla, na-ebuso ndị Filistia agha.
19 Os irmãos de Davi estavam com Saul e o exército israelita no vale de Elá, lutando contra os filisteus.
20 Devid biliri njem nʼisi ụtụtụ, hapụ igwe atụrụ ya nʼaka onye na-elekọta atụrụ, buru onyinye ndị ahụ gawa dịka Jesi nyere ya nʼiwu. Ọ bịarutere ụlọ ikwu ndị Izrel mgbe ha na-apụ nʼihu agha, ha na-etikwa mkpu agha.
20 Davi deixou as ovelhas com outro pastor e, na manhã seguinte, partiu bem cedo com os presentes, como Jessé havia ordenado. Chegou ao acampamento quando o exército israelita saía para o campo de batalha com gritos de guerra.
21 Ndị Izrel na ndị Filistia dokwara onwe ha nʼusoro izute onwe ha nʼagha, ndị agha megide ndị agha.
21 Logo, filisteus e israelitas estavam frente a frente, exército contra exército.
22 Devid hapụrụ ihe ndị ahụ nʼaka onye na-elekọta akpa niile, gbara ọsọ gaa nʼusoro ndị agha jụọ ụmụnne ya banyere udo ha.
22 Davi deixou suas coisas com o responsável pelos suprimentos e correu até a frente de batalha para saudar seus irmãos.
23 Ma mgbe ha na ya nọ na-akparịta ụka, onye mmeri nʼọgbọ agha, onye Filistia nke Gat, Golaịat bụ aha ya, sitere nʼusoro ndị agha Filistia pụta, kwuokwa okwu niile ahụ dịka ọ na-ekwu na mbụ. Devid nụrụ ihe o kwuru.
23 Enquanto falava com eles, Golias, o guerreiro filisteu de Gate, saiu das fileiras do exército filisteu. Davi o ouviu gritar seu desafio habitual.
24 Mgbe ndị Izrel niile hụrụ nwoke a, ha gbara ọsọ pụọ nʼihu ya ma tụọkwa oke egwu.
24 Quando os israelitas viram Golias, começaram a fugir, apavorados.
25 Ndị Izrel sịrị, “Unu hụrụ nwoke a na-eguzo onwe ya? Ọ bụ ka ọ kparịa nnọọ ndị Izrel ka o ji apụta? Eze kwere nkwa inye onye ọbụla ga-etigbu ya akụ nʼebe ọ bara ụba. Ọ ga-akpọnyekwa ya nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya, meekwa ka ndị ezinaụlọ onye ahụ gharakwa ịtụ ụtụ taks ọzọ nʼIzrel!”
25 “Vocês viram aquele homem?”, perguntavam uns aos outros. “Ele sai todos os dias para desafiar Israel. O rei ofereceu uma grande recompensa para quem o matar. Dará uma de suas filhas como esposa e isentará toda a família dele de pagar impostos!”
26 Devid jụrụ ndị ikom nọ ya nso, “Gịnị ka a ga-emere nwoke ga-etigbu onye Filistia a, meekwa ka mkparị a ghara ịdịrị Izrel ọzọ? Onye ka onye Filistia a a na-ebighị ugwu bụ, na ọ ga-apụta na-akparị ndị agha Chineke dị ndụ?”
26 Então Davi perguntou aos soldados que estavam por perto: “O que receberá o homem que matar esse filisteu e acabar com suas provocações contra Israel? Afinal de contas, quem é esse filisteu incircunciso para desafiar os exércitos do Deus vivo?”.
27 Ha gwara ya otu ihe ahụ ha kwuru na mbụ sị ya na ọ bụ ihe ahụ ka a ga-emere onye gburu ya.
27 Os soldados repetiram o que tinham dito e confirmaram: “Sim, essa será a recompensa para quem o matar”.
28 Mgbe Eliab, nwanne Devid nke okenye, nụrụ ka ya na ndị ikom ahụ na-ekwu okwu, o were iwe dị ọkụ megide ya, jụọ ya sị, “Gịnị ka ị bịara ime nʼebe a? Onye kwa ka ị hapụrụ atụrụ ole na ole ndị ahụ nʼọzara? Amaara m ụdị nganga dị nʼime gị na echiche ọjọọ juru gị obi. Ihe ị ji bịa nʼebe a bụ naanị ka ịhụchata ihe na-eme nʼagha.”
28 Quando Eliabe, irmão mais velho de Davi, o ouviu falando com os soldados, ficou furioso e perguntou: “O que você está fazendo aqui? Não devia estar tomando conta daquelas poucas ovelhas? Conheço sua arrogância e suas más intenções. Você quer apenas ver a batalha!”.
29 Ma Devid zara sị ya, “Oleekwanụ ihe m mere ugbu a? Adara m iwu nʼihi na m jụrụ ajụjụ?”
29 “O que eu fiz agora?”, disse Davi. “Só fiz uma pergunta!”
30 Devid chigharịkwara jekwuru onye ọzọ jụọkwa ya otu ajụjụ ahụ. Ọ natakwara otu ụdị ọsịsa ahụ.
30 Então foi até outros soldados, fez a mesma pergunta e recebeu a mesma resposta.
31 Nʼikpeazụ, mgbe a matara ihe bụ uche Devid, e mere ka Sọl mara ihe banyere Devid. Sọl zikwara ozi ka a kpọọ ya.
31 Alguém contou ao rei Saul o que Davi tinha dito, e o rei mandou chamá-lo.
32 Devid sịrị Sọl, “Ka obi onye ọbụla ghara ịda mba nʼihi onye Filistia a; ohu gị ga-aga lụso ya ọgụ.”
32 Davi disse a Saul: “Ninguém se preocupe por causa desse filisteu. Seu servo vai lutar contra ele”.
33 Ma Sọl zaghachiri, “Ị pụghị ibuso onye Filistia a agha, megide ya, nʼihi na i bụ naanị nwantakịrị, ma ya onwe ya bu onye na-ebu agha siterị na mgbe ọ bụ okorobịa.”
33 Saul respondeu: “Você não conseguirá lutar contra esse filisteu e vencer! É apenas um rapaz, e ele é guerreiro desde a juventude”.
34 Ma Devid gwara Sọl sị, “Ohu gị bụ onye na-elekọta atụrụ nna ya. Mgbe ọdụm maọbụ anụ ọhịa bịa bịara buru atụrụ site nʼigwe atụrụ ahụ,
34 Davi, porém insistiu: “Tomo conta das ovelhas de meu pai e, quando um leão ou um urso aparece para levar um cordeiro do rebanho,
35 achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya.
35 vou atrás dele com meu cajado e tiro o cordeiro de sua boca. Se o animal me ataca, eu o seguro pela mandíbula e dou golpes nele com o cajado até ele morrer.
36 Etigburu m ọdụm na anụ ọhịa bịa ahụ, ugbu a, apụkwara m ime onye Filistia a na-amaghị Chineke otu ihe ahụ, nʼihi na ọ kparịala usuu ndị agha Chineke dị ndụ!
36 Fiz isso com o leão e o urso, e farei o mesmo com esse filisteu incircunciso, pois ele desafiou os exércitos do Deus vivo!”.
37 Onyenwe anyị ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!”
37 E disse ainda: “O S enhor que me livrou das garras do leão e do urso também me livrará desse filisteu!”. Por fim, Saul consentiu. “Está bem, então vá”, disse. “E que o S
38 Mgbe ahụ, Sọl yinyere Devid uwe ime ahụ nke ya, yikwasịkwa ya uwe agha igwe, ma kpukwasị ya okpu bronz nʼisi.
38 Então Saul deu a Davi sua própria armadura, incluindo uma couraça e um capacete de bronze.
39 Devid fanyere mma agha nʼime uwe ahụ, malite ijegharị ije, nʼihi na ọ maghị otu e si eyi uwe ndị ahụ ejegharị.
39 Davi prendeu a espada sobre a armadura e tentou dar alguns passos, pois nunca tinha usado essas coisas. “Não consigo andar com tudo isso, pois não estou acostumado”, disse a Saul, e tirou a armadura.
40 Emesịa, o were mkpanaka ya nʼaka ya, site nʼiyi họpụta nkume ise dị mụrụmụrụ tinye ha nʼakpa nta dị nʼime akpa onye ọzụzụ atụrụ ya. O jidere ebe ya nʼaka ya, malite ịpụkwuru onye Filistia ahụ.
40 Pegou cinco pedras lisas de um riacho e as colocou em sua bolsa de pastor. Armado apenas com seu cajado e sua funda, foi enfrentar o filisteu.
41 Onye Filistia ahụ, na-abịa nso na-apụkwute Devid, onye ahụ na-ebu ọta ya na-agakwa nʼihu ya.
41 Golias, com seu escudeiro à frente, caminhava em direção a Davi,
42 O lere Devid anya hụ na ọ bụ naanị nwantakịrị nwoke, onye ahụ dị mma, onye mara mma ile anya. Nʼihi ya, o ledara Devid anya.
42 rindo com desprezo do belo jovem ruivo.
43 Ọ sịrị Devid, “Abụ m nkịta, na i ji mkpanaka na-abịakwute m?” Onye Filistia ahụ ji aha chi niile ya bụọ Devid ọnụ.
43 Gritou para Davi: “Por acaso sou um cão para que você venha a mim com um pedaço de pau?”. E amaldiçoou Davi em nome de seus deuses.
44 Ọ sịrị, “Bịa nʼebe a ka m were anụ ahụ gị mere anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa niile ihe oriri!”
44 “Venha cá, e darei sua carne às aves e aos animais selvagens!”, berrou Golias.
45 Ma Devid sịrị onye Filistia ahụ, “I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha Izrel ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị.
45 Davi respondeu ao filisteu: “Você vem a mim com uma espada, uma lança e um dardo, mas eu vou enfrentá-lo em nome do S enhor dos Exércitos, o Deus dos exércitos de Israel, que você desafiou.
46 Taa ka Onyenwe anyị ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel.
46 Hoje o S enhor entregará você em minhas mãos, e eu o matarei e cortarei sua cabeça. Então darei os cadáveres de seus homens às aves e aos animais selvagens, e o mundo todo saberá que há Deus em Israel!
47 Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na Onyenwe anyị adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke Onyenwe anyị, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.”
47 E todos que estão aqui reunidos saberão que o S enhor salva seu povo, mas não com espada nem com lança. A batalha é do S enhor , e ele entregará vocês em nossas mãos!”.
48 Mgbe onye Filistia ahụ na-abịa nso ibuso ya agha, Devid jiri ọsọ gbara gaa nʼihu agha izute ya.
48 Quando o filisteu se aproximou para atacar, Davi foi correndo enfrentá-lo.
49 Ọ manyere aka nʼime akpa ya wepụta otu nkume, maa ya mata onye Filistia ahụ nʼegedege ihu. Nkume ahụ mikpuru nʼegedege ihu ya, ọ dakwara kpuo ihu nʼala.
49 Enfiou a mão na bolsa, pegou uma pedra e atirou-a com sua funda. A pedra acertou o filisteu na testa e ficou encravada ali. E Golias caiu com o rosto em terra.
50 Otu a ka Devid si jiri ebe na nkume merie onye Filistia ahụ. O gburu onye Filistia ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya.
50 Assim, Davi venceu o filisteu e o matou com apenas uma funda e uma pedra, pois não tinha espada.
51 Devid gbaara ọsọ jeruo nʼebe Golaịat dara, mịịrị mma agha ya site nʼọbọ, jiri ya gbuo ya. O ji ya bepụkwa isi ya!
51 Em seguida, correu até o filisteu, puxou da bainha a espada dele e a usou para matá-lo e cortar-lhe a cabeça. Quando os filisteus viram que seu melhor guerreiro estava morto, deram meia-volta e fugiram.
52 Mgbe ahụ, ndị agha Izrel na Juda tiri mkpu ọṅụ, biliekwa, malite ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ha chụrụ ha ọsọ chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama Gat, na nʼọnụ ụzọ ama Ekrọn. Ndị Filistia nwụrụ anwụ dara nnọọ aghara aghara nʼụzọ Shaaraim nke gawara Gat na Ekrọn.
52 Os soldados de Israel e de Judá soltaram um forte grito de vitória e perseguiram os filisteus até Gate e até os portões de Ecrom. E os corpos dos filisteus mortos e feridos ficaram espalhados pelo caminho de Saarim até Gate e Ecrom.
53 Emesịa, ndị Izrel lọghachiri bịa kwakọrọ ihe niile dị nʼụlọ ikwu ndị Filistia, nke ha hapụrụ gbaa ọsọ.
53 Então o exército israelita voltou e saqueou o acampamento abandonado dos filisteus.
54 Devid buuru isi onye Filistia bulata na Jerusalem. Ma dobe ngwa agha onye Filistia ahụ nʼime ụlọ ikwu nke ya.
54 (Davi levou a cabeça do filisteu para Jerusalém, mas guardou as armas dele em sua própria tenda.)
55 Mgbe Sọl nọ na-ele Devid anya ka ọ na-apụ izute onye Filistia ahụ, ọ sịrị Abna, ọchịagha ya, “Abna, nwa onye ka nwokorobịa ahụ bụ?”
55 Quando Saul viu Davi sair para lutar contra os filisteus, perguntou a Abner, o comandante de seu exército: “Abner, quem é o pai desse rapaz?”. “Não faço ideia, ó rei!”, disse Abner.
56 Eze zara sị, “Chọpụta onye mụrụ nwokorobịa a.”
56 “Então descubra quem é o pai dele!”, ordenou.
57 Mgbe Devid si nʼigbu onye Filistia ahụ lọghachi, Abna duuru ya, dute ya nʼihu Sọl. Isi onye Filistia a dịkwa nʼaka Devid.
57 Assim que Davi voltou, depois de matar Golias, Abner o levou a Saul. Ele ainda carregava a cabeça do filisteu em suas mãos.
58 Sọl jụrụ ya sị, “Nwokorobịa, nwa onye ka ị bụ?”
58 Saul perguntou: “Quem é seu pai, meu rapaz?”. E Davi respondeu: “Sou filho de Jessé, que vive em Belém”.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Samuel 17, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.