1 Reis 18
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC
1 Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nʼafọ nke atọ, okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja ntị, “Bilie, gaa gosi Ehab onwe gị. Aga m emekwa ka mmiri zookwa nʼala a.”
1 Passado muito tempo, foi a palavra de Deus dirigida a Elias no terceiro ano, nestes termos: Vai apresentar-te diante de Acab, eu vou fazer chover sobre a terra.
2 Ya mere, Ịlaịja pụrụ gaa igosi Ehab onwe ya.
2 Elias partiu e foi apresentar-se a Acab. A fome devastava violentamente a Samaria.
3 O nwere otu nwoke na-elekọta ihe dị nʼezinaụlọ Ehab. Aha ya bụ Ọbadaya. (Ọ bụ nwoke ji obi ya niile kwere na Onyenwe anyị.
3 Acab mandou chamar Abdias, seu intendente. Abdias era um homem fervoroso adorador do Senhor.
4 Mgbe eze nwanyị bụ Jezebel na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị chọọ igbuchapụ ha, ọ bụ Ọbadaya zoro narị ndị amụma nʼime ha nʼime ọgba nkume. O zoro iri ndị amụma ise nʼotu ọgba nkume, zookwa iri ndị amụma ise fọdụrụ nʼime ọgba nkume ọzọ. Emesịa, ọ na-ewegara ha nri na mmiri nʼebe ahụ.)
4 Quando Jezabel massacrou os profetas do Senhor, Abdias tomou cem profetas e escondeu-os em duas cavernas, cinqüenta numa e cinqüenta noutra, onde lhes tinha providenciado o que comer e beber.
5 Ehab kpọrọ Ọbadaya sị ya, “Jegharịa nʼala a niile nyochapụta na ndagwurugwu na isi iyi niile, ebe ahịhịa ndụ dị. Gbutere ịnyịnya na ịnyịnya muul m ahịhịa ahụ ka ha taa ghara ịnwụ, ka anyị gharakwa igbu ha.”
5 Acab disse-lhe: Percorre a terra; vai a todas as fontes e a todas as torrentes; talvez encontremos erva para conservar a vida aos cavalos e aos burros, evitando assim abater uma parte de nossos animais.
6 Ha kere ala ahụ nʼetiti onwe ha. Ehab sitere otu akụkụ, ma Ọbadaya sitere akụkụ nke ọzọ.
6 E repartiram entre si a terra para percorrê-la. Acab foi por um lado, sozinho, e Abdias tomou uma direção contrária.
7 Ọ dịghị anya, na mberede, Ọbadaya hụrụ Ịlaịja ka ọ na-abịa izute ya. Ọbadaya matara na ọ bụ ya. Nʼihi ya, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala sị, “Ọ bụ gị ka m hụrụ nʼezie, onyenwe m, Ịlaịja?”
7 Enquanto Abdias caminhava, eis que veio Elias ao seu encontro. Abdias reconheceu-o e prostrou-se com o rosto por terra, dizendo: És tu, meu senhor Elias?
8 Ịlaịja zara sị ya, “E, ọ bụ m. Ugbu a gaa gwa onyenwe gị, ‘mụ bụ Ịlaịja nọ nʼebe a.’ ”
8 Sim, sou eu. Vai dizer ao teu amo: Elias está aí.
9 Mgbe ahụ, Ọbadaya jụrụ Ịlaịja sị, “Gịnị bụ ihe m mejọrọ, nke mere i ji na-achọ inyefe ohu gị nʼaka Ehab ka o gbuo ya?
9 Abdias replicou: Que pecado cometi eu, para que entregues assim o teu servo nas mãos de Acab, para ele me matar?
10 Dịka Onyenwe anyị Chineke gị sị adị ndụ, o nwebeghị mba maọbụ alaeze dị nke nna m ukwu na-ezigaghị mmadụ ịchọ gị. Ebe ọbụla ọ gara a na-akọrọ ya na Ịlaịja anọghị nʼebe ahụ. Ehab na-eme ka eze obodo ahụ ṅụọ iyi na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.
10 Pela vida de Deus, não há nação, nem reino aonde meu amo não te tenha mandado buscar. E diziam: Elias não está aqui; e ele fazia jurar reino e povo que não te haviam achado.
11 Ma ugbu a, ị na-asị m gaa gwa Onyenwe m na, ‘Ịlaịja nọ nʼebe a.’
11 E agora tu me dizes: Vai dizer ao teu amo: Elias está aí.
12 Ọ bụrụkwanụ na m esite nʼebe a pụọ, onye ma ebe Mmụọ Onyenwe anyị ga-ebuga gị. Mgbe ahụ, ọ bụrụ na Ehab abịa hapụ ịhụ gị, ọ ga-egbu m. Nʼihi na mụ bụ ohu gị bụ onye na-efe Onyenwe anyị ofufe siterị na mgbe m bụ okorobịa.
12 Mas quando eu me apartar de ti, o Espírito do Senhor te levará para não sei onde, e Acab, informado por mim, não te encontrando, matar-me-á. Ora, o teu servo teme o Senhor desde a sua juventude.
13 Ọ bụ na onyenwe m anụghị ihe m mere mgbe Jezebel nọ na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị? E zoro narị ndị amụma Onyenwe anyị nʼime ọgba nkume abụọ, iri ise nʼime otu ọgba nkume, iri ise nʼime otu ọgba nkume ka m zoro ha, jirikwa nri na mmiri ọṅụṅụ zụọ ha.
13 Porventura não foi dito ao meu senhor o que eu fiz quando Jezabel massacrava os profetas do Senhor? Escondi cem deles, cinqüenta numa caverna e cinqüenta noutra, e os sustentei ali.
14 Ma ugbu a i na-agwa m sị m, ‘Gaa gwa onyenwe gị na Ịlaịja abịala.’ Ọ ga-egbukwa m!”
14 E agora tu me dizes: Vai dizer ao teu amo: Elias está aí! Ele me matará!
15 Ma Ịlaịja zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, onye m na-ejere ozi, ana m agwa gị na agaghị m esi nʼebe a pụọ tutu ruo mgbe m gosiri Ehab onwe m taa.”
15 Elias respondeu-lhe: Pela vida do Senhor dos Exércitos a quem sirvo, hoje mesmo me apresentarei diante de Acab.
16 Mgbe ahụ, Ọbadaya pụrụ gaa kọọrọ Ehab na Ịlaịja abịala. Emesịa, Ehab pụtara izute Ịlaịja.
16 Abdias correu para junto de Acab e deu-lhe a nova. Acab saiu ao encontro de Elias.
17 Mgbe ọ hụrụ Ịlaịja, Ehab sịrị ya, “Ọ bụ gị onwe gị bụ nke a, gị onye na-emekpa Izrel ahụ?”
17 Ao vê-lo, Acab lhe disse: Eis-te aqui, o perturbador de Israel!
18 Ịlaịja zara sị Ehab, “O nweghị mgbe m ji butere Izrel nsogbu. Ọ bụ gị onwe gị na ezinaụlọ nna gị na-ebutere Izrel nsogbu. Unu agbakụtala iwu Onyenwe anyị azụ, gbasoro chi Baal dị iche iche.
18 Não sou eu o perturbador de Israel, respondeu Elias, mas tu, sim, e a casa de teu pai, porque abandonastes os preceitos do Senhor e tu seguiste aos Baal.
19 Ugbu a, kpọkọta ndị Izrel niile ka ha zute m nʼugwu Kamel. Kpọpụtakwa ndị amụma Baal ọnụọgụgụ ha dị narị anọ na iri mmadụ ise, na ndị amụma Ashera, ndị dị narị anọ, bụ ndị na-eso eze nwanyị Jezebel erikọ ihe na tebul ya.”
19 Convoca, pois, à montanha do Carmelo, junto de mim, todo o Israel com os quatrocentos e cinqüenta profetas de Baal e os quatrocentos profetas de asserá, que comem à mesa de Jezabel.
20 Ehab zigara ozi kpọkọta ndị Izrel niile, na ndị amụma ahụ niile. Ha niile bịakwara nʼugwu Kamel.
20 Mandou Acab avisar a todos os israelitas e reuniu os profetas no monte Carmelo.
21 Ịlaịja gara nʼihu ndị a, sị ha, “Ọ bụ ruo ole mgbe ka unu ga-akwụsị inwe obi abụọ? Ọ bụrụ na Onyenwe anyị bụ Chineke unu, soronụ ya! Ma ọ bụrụkwanụ na unu ekpebie na Baal bụ chi unu, soronụ ya.”
21 Elias, aproximando-se de todo o povo, disse: Até quando claudicareis dos dois pés? Se o Senhor é Deus, segui-o, mas se é Baal, segui a Baal! O povo nada respondeu.
22 Mgbe ahụ Ịlaịja sịrị ha, “Leenụ! Ọ bụ mụ onwe m, naanị m, bụ onye amụma Onyenwe anyị fọdụrụ, ma ndị amụma Baal dị narị anọ na iri ise nʼọnụọgụgụ.
22 Elias continuou: Eu sou o único dos profetas do Senhor que fiquei, enquanto os de Baal são quatrocentos e cinqüenta.
23 Ugbu a wetanụ oke ehi abụọ ka ndị amụma Baal họrọ otu oke ehi, nke ha chọrọ. Ha ga-egbujasị ya, tụkwasị ya nʼelu nkụ dị nʼebe ịchụ aja, ma ha agaghị amụnye ọkụ ọbụla nʼokpuru ya. Mụ onwe m ga-akwado oke ehi nke ọzọ tụkwasị ya nʼelu nkụ ma agaghị m amụnyekwa ọkụ nʼokpuru ya.
23 Dê-se-nos, portanto, um par de novilhos: eles escolherão um, fá-lo-ão em pedaços, e o colocarão sobre a lenha, mas sem meter fogo por baixo; eu tomarei o outro novilho e pô-lo-ei sobre a lenha, sem meter fogo por baixo.
24 Emesịa, unu ga-akpọku chi Baal unu, mụ onwe m kwa ga-akpọku aha Onyenwe anyị. Ọ ga-erukwa na chi ga-eji ọkụ za, chi ahụ bụ Chineke.”
24 Depois disso, invocareis o nome de vosso deus, e eu invocarei o nome do Senhor. Aquele que responder pelo fogo, esse será reconhecido como o {verdadeiro} Deus. Todo o povo respondeu: É boa a proposta.
25 Ịlaịja gwara ndị amụma Baal, sị, “Ebe unu dị ọtụtụ, burunu ụzọ họrọ otu oke ehi nʼime ehi abụọ a dozie ya. Unu amụnyekwala ya ọkụ nʼokpuru, kama kpọkuonụ chi unu.”
25 Então disse Elias aos profetas de Baal: Escolhei vós primeiro um novilho e preparai-o, porque sois mais numerosos, e invocai o vosso deus, mas não ponhais fogo.
26 Ya mere, ndị amụma Baal weere oke ehi ahụ e nyere ha doziekwa ya.
26 Eles tomaram o novilho que lhes foi dado e fizeram-no em pedaços. Em seguida, puseram-se a invocar o nome de Baal desde a manhã até o meio-dia, gritando: Baal, responde-nos! Mas não houve voz, nem resposta. E dançavam ao redor do altar que tinham levantado.
27 Nʼihe dị ka nʼetiti ehihie, Ịlaịja malitere ịchị ha ọchị, na ịkwa ha emo. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Tisienụ mkpu ike ka Baal nwe ike ịnụ arịrịọ unu. Nʼezie, ọ bụ chi! Ma eleghị anya ọ nọ nʼoke echiche, maọbụ o ji ọrụ nʼaka, maọbụ ọ gara njem. Ma eleghị anya ọ na-arahụ ụra. Ọ chọrọ onye ga-akpọte ya.”
27 Sendo já meio-dia, Elias escarnecia-os, dizendo: Gritai com mais força, pois {seguramente!} ele é deus; mas estará entretido em alguma conversa, ou ocupado, ou em viagem, ou estará dormindo... e isso o acordará.
28 Ndị amụma a tiri mkpu nʼoke olu dịka ha si eme. Ha ji mma na ùbe na-egbukasị onwe ha ahụ, tutu ruo mgbe ọbara malitere isite ha nʼahụ na-agbapụta.
28 Eles gritavam, com efeito, em alta voz, e retalhavam-se segundo o seu costume, com espadas e lanças, até se cobrirem de sangue.
29 Ma mgbe etiti ehihie gasịrị, ha nọgidekwara na-ebu amụma ruo mgbe oge ịchụ aja uhuruchi ruru, ma o nweghị onye zara ha, o nwekwaghị olu a nụrụ. Ọ dịkwaghị onye ṅara ha ntị.
29 Passado o meio-dia, enquanto continuavam em seus transes proféticos, chegou a hora da oblação. Mas não houve voz, nem resposta, nem sinal algum de atenção.
30 Mgbe ahụ, Ịlaịja kpọrọ ndị Izrel sị ha, “Bịaruenụ m nso.” Ha niile bịaruru ya nso, o doziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, bụ ndị ahụ a kwaturu nʼala na mbụ.
30 Então Elias disse ao povo: Aproximai-vos de mim, e todos se aproximaram. Elias reparou o altar demolido do Senhor.
31 Ịlaịja chịịrị nkume iri na abụọ, nke otu nʼime ha nọchiri anya otu ebo Jekọb, onye okwu Onyenwe anyị rutere si ya, “Aha gị ga-abụ Izrel.”
31 Tomou doze pedras, segundo o número das doze tribos saídas dos filhos de Jacó, a quem o Senhor dissera: Tu te chamarás Israel.
32 O ji nkume ndị a wuzie ebe ịchụ aja Onyenwe anyị. Emesịa, o gwuru olulu miri emi, nke gbara ebe ịchụ aja ahụ gburugburu.
32 E erigiu com essas pedras um altar ao Senhor. Fez em volta do altar uma valeta, com a capacidade de duas medidas de semente.
33 Ọ tụkwasịrị nkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, tụkwasịkwa otu oke ehi o gbujasịrị nʼelu nkụ ndị ahụ. Emesịa, o nyere ndị nọ nʼebe ahụ iwu sị ha, “Gbajuonụ ite anọ mmiri. Butekwanụ mmiri ahụ bịa wụkwasị ya nʼelu aja nsure ọkụ a, na nʼelu nkụ ndị a.” Mgbe ha mesiri nke a, Ịlaịja gwara ha okwu sị,
33 Dispôs a lenha e colocou sobre ela o boi feito em pedaços.
34 “Gbajukwaanụ ite mmiri ndị ahụ, bute ha bịa wụkwasị mmiri ahụ nke ugboro abụọ nʼelu aja nsure ọkụ a.” Ha mere dịka Ịlaịja kwuru.
34 E disse: Enchei quatro talhas de água e derramai-a em cima do holocausto e da lenha. Depois disse: Fazei isso segunda vez. Tendo-o eles feito, disse: Ainda uma terceira vez. Eles obedeceram.
35 Mmiri jupụtakwara nʼebe ịchụ aja ahụ, na olulu ahụ dị ya gburugburu.
35 A água correu em volta do altar e a valeta ficou cheia.
36 Mgbe oge e ji achụ aja anyasị ruru, Ịlaịja, onye amụma bịara ebe ịchụ aja ahụ nso kpee ekpere sị, “O, Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Izrel, biko gosi taa na ọ bụ gị onwe gị bụ naanị Chineke nʼIzrel, na mụ onwe m bụkwa ohu gị. Gosikwa na m bụ onyeozi gị, na ọ bụ ihe i nyere m nʼiwu ka m mere oge ndị a niile.
36 Chegou a hora da oblação. O profeta Elias adiantou-se e disse: Senhor, Deus de Abraão, de Isaac e de Israel, saibam todos hoje que sois o Deus de Israel, que eu sou vosso servo e que por vossa ordem fiz todas estas coisas.
37 Biko, Onyenwe anyị m, zaa m ekpere m, zaa m ya, ka ndị Izrel niile mata na gị onwe gị, Onyenwe anyị bụ Chineke, na gị onwe gị na-atụgharịkwa obi ha ịlaghachikwute gị.”
37 Ouvi-me, Senhor, ouvi-me: que este povo reconheça que vós, Senhor, sois Deus, e que sois vós que converteis os seus corações!
38 Mgbe ahụ, na mberede, ọkụ Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe daa, rechapụ oke ehi ahụ, na nkụ ahụ, na nkume, na ntụ, ma rechapụkwa mmiri niile dị nʼime olulu ahụ dị gburugburu ebe ịchụ aja ahụ.
38 Então, subitamente, o fogo do Senhor baixou do céu e consumiu o holocausto, a lenha, as pedras, a poeira e até mesmo a água da valeta.
39 Mgbe ndị mmadụ ahụ niile hụrụ ihe a mere, ha niile dara nʼala kpuo ihu nʼala, na-eti mkpu na-asị, “Onyenwe anyị, ya onwe ya bụ Chineke! Onyenwe anyị ya onwe ya bụ Chineke!”
39 Vendo isso, o povo prostrou-se com o rosto por terra, e exclamou: O Senhor é Deus! O Senhor é Deus!
40 Mgbe ahụ, Ịlaịja nyere ha iwu sị, “Jidenụ ndị amụma Baal niile. Unu ekwekwala ka otu onye nʼime ha laa.” Ha jidekwara ha niile. Ịlaịja dukwaara ha niile gaa na ndagwurugwu iyi Kishọn, gbuo ha nʼebe ahụ.
40 Elias disse-lhes: Tomai agora os profetas de Baal; não deixeis escapar um só deles! Tendo-os o povo agarrado, Elias levou-os ao vale de Cison e ali os matou.
41 Emesịa, Ịlaịja gwara Ehab okwu sị, “Gaa rie nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ; nʼihi na anụrụ m ụzụ oke mmiri ozuzo ka ọ na-ada.”
41 Então Elias disse a Acab: Vai, come e bebe, porque já ouço o ruído de uma grande chuva.
42 Nʼihi nke a, Ehab sitere nʼebe ahụ pụọ gaa iri nri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma Ịlaịja rigooro nʼelu ugwu Kamel gbuo ikpere nʼala, kpuokwa ihu ya nʼala nʼetiti ikpere ya abụọ ikpe ekpere.
42 Voltou Acab para comer e beber, enquanto Elias subiu ao cimo do monte Carmelo, onde se encurvou por terra, pondo a cabeça entre os joelhos.
43 Nʼoge a, ọ gwara nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Gaa lee anya nʼụzọ oke osimiri.” Ọ rịgoro lee anya, sị,
43 Disse ao seu servo: Sobe um pouco, e olha para as bandas do mar. Ele subiu, olhou {o horizonte} e disse: Nada. Por sete vezes, Elias disse-lhe: Volta e {olha}.
44 O ruo na nke ugboro asaa, nwokorobịa ahụ bịaghachiri sị Ịlaịja, “Onyenwe m, ahụrụ m igwe ojii dị nta dịka ọbụ aka mmadụ ka o si nʼoke osimiri na-apụta.”
44 Na sétima vez o servo respondeu: Eis que, sobe do mar uma pequena nuvem, do tamanho da palma da mão. Elias disse-lhe: Vai dizer a Acab que prepare o seu carro e desça, para que a chuva não o detenha.
45 Ọ dịghị anya, eluigwe gbajikọtara nnọọ oji. Oke ifufe bidokwara ife. Mmiri dị ukwuu bidokwara izo. Mgbe ahụ, Ehab gbaara ụgbọ agha ya laa Jezril.
45 Num instante, o céu se cobriu de nuvens negras, soprou o vento e a chuva caiu torrencialmente. Acab subiu ao seu carro e partiu para Jezrael.
46 Ma ike Onyenwe anyị bịakwasịrị Ịlaịja. Ọ fanyere ọnụ uwe mwụda ya na belịt o kere nʼukwu, gbapụ ọsọ buru Ehab ụzọ gbaruo obodo Jezril.
46 A mão do Senhor veio sobre Elias, o qual, tendo cingido os rins, passou adiante de Acab e chegou à entrada de Jezrael.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Reis 18, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.