1 Reis 13
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NTLH
1 Otu onye nke Chineke si Juda bịa Betel, site nʼokwu nke Onyenwe anyị oge Jeroboam guzo nʼebe ịchụ aja ka ọ chụọ aja.
1 Por ordem do Senhor Deus, um profeta de Judá foi a Betel e chegou ali quando Jeroboão estava diante do altar para oferecer o sacrifício .
2 O tiri mkpu nʼoke olu megide ebe ịchụ aja ahụ dịka okwu Onyenwe anyị si dị, “Ebe ịchụ aja, ebe ịchụ aja! Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: ‘A ga-amụ otu nwa nwoke nʼụlọ Devid, aha ya ga-abụ Josaya. Ọ ga-eji ndị nchụaja niile nke ebe dị elu, bụ ndị na-achụ aja nʼelu gị, chụọ aja nʼelu gị. A ga-esurekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ ọkụ nʼelu gị.’ ”
2 Seguindo a ordem do Senhor , o profeta falou assim contra o altar: — Ó altar, ó altar! O que o
3 Nʼụbọchị ahụ, onye nke Chineke ahụ kwuru okwu banyere ihe ịrịbama ga-emezu. O kwuru sị, “Nke a bụ ihe ịrịbama Onyenwe anyị ji emesi okwu ya ike: Ebe ịchụ aja a ga-agbawa ụzọ abụọ. Ntụ dị nʼelu ya ga-awụsasị nʼala.”
3 E o profeta continuou: — Este altar cairá em pedaços, e as cinzas que estiverem nele se espalharão. Essa será a prova de que o
4 Mgbe eze Jeroboam nụrụ ihe onye nke Chineke ahụ kwuru megide ebe ịchụ aja Betel, o setịpụrụ aka ya site nʼebe ịchụ aja ahụ sị, “Jidenụ nwoke a!” Ma aka ahụ ọ setịpụrụ tụgide nwoke ahụ kpọnwụrụ na o nwekwaghị ike iweghachi ya azụ ọzọ.
4 Quando Jeroboão ouviu isso, apontou para o profeta e ordenou: — Prendam este homem! No mesmo instante, o braço do rei ficou paralisado, e ele não pôde fazê-lo voltar à posição normal.
5 Ọzọkwa, ebe ịchụ aja ahụ gbawara abụọ, ntụ dị nʼelu ya wụsịkwara nʼala dịka ihe ịrịbama nke onye amụma Chineke nyere, site nʼokwu Onyenwe anyị.
5 E, de repente, o altar caiu em pedaços, e as cinzas se espalharam pelo chão, como o profeta, em nome do Senhor , tinha dito que ia acontecer.
6 Mgbe ahụ, eze sịrị onye nke Chineke ahụ, “Biko, rịọọ Onyenwe anyị Chineke gị, kpekwara m ekpere ka e nyeghachi m aka m.” Ya mere, onye nke Chineke ahụ rịọrọ Onyenwe anyị site nʼekpere, emekwara ka aka eze dịghachi dịkwa ka ọ dị na mbụ.
6 Então o rei disse ao profeta: — Por favor, acalme o O profeta fez o que o rei pediu, e o braço do rei sarou.
7 Emesịa, eze gwara onye nke Chineke ahụ okwu sị, “Soro m gaa nʼụlọ m. Aga m enye gị ihe oriri, nyekwa gị onyinye.”
7 Então o rei disse: — Venha comigo até a minha casa e coma alguma coisa. Eu vou recompensar você pelo que fez.
8 Ma onye nke Chineke ahụ zara eze sị, “Ọ bụrụ na i nye m ọkara ihe niile i nwere, agaghị m eso gị baa nʼime ụlọ gị. Agaghị m erikwa nri gị maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe a.
8 Mas o profeta respondeu: — Mesmo que o senhor me desse a metade da sua riqueza, eu não iria com o senhor e não comeria, nem beberia nada neste lugar.
9 Nʼihi na-enyere m iwu site nʼokwu Onyenwe anyị, sị, ‘Erila nri, aṅụkwala mmiri, esitekwala ụzọ i si gaa laghachi.’ ”
9 O Senhor Deus mandou que eu não comesse, nem bebesse nada e que não voltasse para casa pelo mesmo caminho por onde vim.
10 Ya mere, o sitere nʼụzọ ọzọ lawa, nke na-abụghị ụzọ o si bịa Betel.
10 E assim ele não voltou pelo mesmo caminho por onde tinha ido, mas voltou por outra estrada.
11 Ma o nwere otu onye amụma bụ agadi bi na Betel. Onye ụmụ ya bịara kọọrọ ihe niile onye nke Chineke ahụ mere nʼụbọchị ahụ na Betel, ha kọkwaara nna ha ihe niile ọ gwara eze.
11 Naquele tempo havia um velho profeta que morava em Betel. Os seus filhos chegaram e contaram a ele tudo o que o profeta de Judá tinha feito naquele dia em Betel e o que tinha dito ao rei Jeroboão.
12 Nna ha jụrụ ha, “Olee ụzọ ọ gara?” Ụmụ ya ndị ikom ziri ya ụzọ nke onye nke Chineke ahụ si Juda gara.
12 Então o velho profeta perguntou: — Por onde ele foi embora? E eles lhe mostraram a estrada.
13 Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu m.” Ha jikekwaara ya ịnyịnya ibu, ọ nọkwasịrị nʼelu ya.
13 Ele pediu que os filhos pusessem a sela no seu jumento, e eles puseram. Então o profeta montou
14 Ọ gbasooro onye nke Chineke nʼazụ, ọ hụrụ ya ka ọ nọ ala nʼokpuru osisi ook, Ọ sịrị ya, “Ọ bụ gị bụ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa?”
14 e foi atrás do profeta de Judá. Ele o encontrou sentado debaixo de uma árvore sagrada e perguntou: — Você é o profeta de Judá? — Sou, sim! — respondeu o homem.
15 Onye amụma ahụ sịrị ya, “Soro m ka anyị gaa nʼụlọ m, ka i rie nri.”
15 — Venha até a minha casa e coma alguma coisa comigo — convidou ele.
16 Ma ọ sịrị, “Apụghị m iso gị laghachi azụ, maọbụ rie nri, ma ọ bụkwa ṅụọ mmiri ọbụla nʼebe a.
16 Mas o profeta de Judá respondeu: — Eu não posso ir até a sua casa, nem ficar hospedado lá. E também não vou comer, nem beber nada aqui com você
17 Nʼihi na a gwara m site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Erikwala nri maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe ahụ, maọbụ soro ụzọ ị si gaa lọtakwa.’ ”
17 porque o Senhor Deus mandou que eu não comesse, nem bebesse nada e que não voltasse para casa pelo mesmo caminho por onde vim.
18 Ma onye nke ọzọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụkwa onye amụma dịka gị, mmụọ ozi zikwara m ozi site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Kpọrọ ya ka o soro gị laghachi nʼụlọ gị, ka o rie nri, ṅụọkwa mmiri.’ ” (Ma ọ gwara ya okwu ụgha.)
18 Então o velho profeta disse: — Eu também sou profeta como você, e o Mas ele estava mentindo.
19 Ya mere, nwoke nke Chineke ahụ soro ya laghachi rie nri, ṅụọkwa mmiri.
19 Então o profeta de Judá foi com o velho profeta para a sua casa e comeu uma refeição com ele.
20 Ma mgbe ha abụọ nọdụ na-eri ihe na tebul, okwu Onyenwe anyị rutere onye amụma agadi ahụ ntị, bụ onye mere ka ọ lọghachi azụ.
20 Enquanto estavam sentados à mesa, a palavra do Senhor veio ao velho profeta,
21 Ọ kpọrọ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na ị nupula isi nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị, hapụ idebe iwu Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị.
21 e ele gritou para o profeta de Judá: — O
22 Ị laghachikwara nʼebe a, rie nri, ṅụọkwa mmiri, bụ ebe ọ gwara gị sị gị, erila nri, aṅụkwala mmiri. Ya mere, agaghị eli ozu gị nʼala ili nna gị ha.’ ”
22 Em vez disso, voltou e comeu uma refeição num lugar onde ele havia mandado que você não comesse. Por causa disso, você será morto, e o seu corpo não será sepultado no túmulo da sua família.
23 Mgbe onye nke Chineke ahụ risiri nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, ha kwadooro ya ịnyịnya ibu nke onye amụma ahụ kpọghachiri ya azụ.
23 Depois que acabaram de comer, o velho profeta selou o jumento para o profeta de Judá,
24 Dịka ọ na-alaghachi, otu ọdụm zutere ya nʼụzọ, dọgbuo ya. Ma ọ hapụrụ ozu ya ka ọ tọgbọrọ nʼokporoụzọ, ma ịnyịnya ibu ya ma ọdụm ahụ dọgburu nwoke ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ya.
24 e este foi embora. No caminho, um leão o encontrou e matou. O corpo do profeta ficou jogado na estrada, e o leão e o jumento ficaram parados ali perto dele.
25 Ndị mmadụ na-agafe hụrụ ozu ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ, hụkwa ka ọdụm ahụ guzo nʼakụkụ ya. Ndị a gara kọọ akụkọ ihe ha hụrụ nʼụzọ nʼobodo ebe onye amụma agadi ahụ bi.
25 Alguns homens passaram por aquele lugar e viram o corpo jogado no caminho e o leão ali do lado. Então foram a Betel e contaram o que tinham visto.
26 Mgbe onye amụma ahụ mere ka ọ laghachi azụ nụrụ ihe mere, ọ sịrị, “Ọ bụ onye nke Chineke ahụ nupuru isi nʼokwu Onyenwe anyị. Onyenwe anyị enyefeela ya nʼaka ọdụm, nke dọgburu ma gbukwaa ya, dịka okwu Onyenwe anyị dọrọ ya aka na ntị.”
26 Quando o velho profeta soube do que havia acontecido, disse: — Aquele é o profeta que desobedeceu às ordens de Deus, o
27 Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu.” Ha mere otu a.
27 Então disse para os filhos: — Ponham a sela no meu jumento. Eles fizeram o que o pai pediu.
28 Ọ pụrụ gaa chọta ozu nwoke ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ. Ịnyịnya ibu ya na ọdụm ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ahụ. Ọdụm erighị anụ nwoke ahụ, ọ dọgbukwaghị ịnyịnya ibu ahụ.
28 Então o velho foi e achou o corpo do profeta caído no caminho e o jumento e o leão parados perto dele. O leão não havia comido o corpo, nem despedaçado o jumento.
29 Onye amụma agadi ahụ buliri ozu onye nke Chineke ahụ dọkwasị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buru ya bughachi ya nʼobodo, nʼihi iruru ya ụjụ, nakwa ili ya.
29 Aí o velho profeta pegou o corpo, pôs em cima do jumento e o levou de volta para Betel a fim de chorar sobre ele e sepultá-lo.
30 O liri ozu onye nke Chineke ahụ nʼili nke aka ya. Mgbe o liri ya, ọ kwara akwa sị, “Ewoo nwanna m!”
30 Ele o sepultou no seu próprio túmulo. Então ele e os seus filhos choraram sobre o corpo do profeta e diziam: — Ó meu irmão, meu irmão!
31 Mgbe o lisiri ya, ọ gwara ụmụ ya ndị ikom sị, “Mgbe m nwụrụ, lienụ m nʼotu ili a e liri onye nke Chineke; doonụ ọkpụkpụ m ka ọ dịrị nʼakụkụ ọkpụkpụ ya.
31 Depois do sepultamento, o velho disse aos filhos: — Quando eu morrer, me sepultem neste túmulo e ponham o meu corpo perto do dele.
32 Nʼihi na ozi ahụ niile o ziri site nʼokwu Onyenwe anyị megide ebe ịchụ aja dị na Betel, na megidekwa ebe ụlọ arụsị niile dị nʼebe dị elu nʼobodo Sameria aghaghị imezu.”
32 Porque certamente vai se cumprir a ameaça que ele fez por ordem de Deus, o Senhor , contra o altar de Betel e contra os lugares pagãos de adoração que existem nas cidades da região de Samaria.
33 Nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, Jeroboam esiteghị nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Kama ọ gara nʼihu họpụta ndị nchụaja maka ebe niile dị elu site nʼetiti ndị mmadụ efu. Onye ọbụla chọrọ ị bụ onye nchụaja ka o doro nsọ maka ije ozi nʼebe niile dị elu.
33 Ainda assim o rei Jeroboão não se arrependeu dos seus maus caminhos, mas continuou a escolher para sacerdotes homens de todo tipo a fim de servirem nos altares dos morros. O rei ordenava como sacerdote desses altares qualquer um que queria ser sacerdote.
34 Nke a bụ mmehie ezinaụlọ Jeroboam. Ọ bụ ya mere alaeze Jeroboam ji daa, meekwa ka e kpochapụ ya nʼelu ụwa.
34 Esse seu pecado trouxe desgraça e destruição total para a sua família.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Reis 13, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.