1 Reis 11
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs VC
1 Ma eze Solomọn hụrụ ọtụtụ ndị inyom mba ọzọ nʼanya, tinyere nwa nwanyị Fero, ha bụ ndị inyom ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị Saịdọn na ndị Het.
1 O rei Salomão, além da filha do faraó, amou muitas mulheres estrangeiras: moabitas, amonitas, edomitas, sidônias e hitéias,
2 Ha bụ ndị sitere na mba ndị ahụ Onyenwe anyị gwara Izrel sị, “Unu na ha agaghị alụrịtakwa di na nwunye, nʼihi na ha aghaghị ime ka obi unu gbasoo chi niile ha.” Ma, nʼagbanyeghị nke a, Solomọn rapara ha nʼahụ nʼihi ịhụnanya.
2 pertencentes às nações das quais o Senhor dissera aos israelitas: Não tereis relações com elas, nem elas tampouco convosco, porque certamente vos seduziriam os corações arrastando-os para os seus deuses.
3 Ọnụọgụgụ ndị inyom Solomọn lụrụ dị narị asaa, bụ ndị amụrụ nʼobi ndị eze. O nwekwara ndị iko nwanyị, ọnụọgụgụ ha dị narị atọ. Ndị inyom ya duhiere obi ya.
3 A estas nações uniu-se Salomão por seus amores. Teve setecentas esposas de classe principesca e trezentas concubinas. E suas mulheres perverteram-lhe o coração.
4 Mgbe Solomọn ghọrọ agadi, ndị inyom ndị a duhiere obi ya mee ka ọ gbasoo chi ndị ọzọ, nke mere na o jikwaghị obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka Devid bụ nna ya mere.
4 Sendo já velho, elas seduziram o seu coração para seguir outros deuses. E o seu coração já não pertencia sem reservas ao Senhor, seu Deus, como o de Davi, seu pai.
5 Ọ gbasoro Ashtọret, bụ chi ndị Saịdọn na Molek, bụ chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.
5 Salomão prestou culto a Astarte, deusa dos sidônios, e a Melcom, o abominável ídolo dos amonitas.
6 Nʼụzọ dị otu a, Solomọn mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O soghị ụzọ Onyenwe anyị dịka nna ya Devid si mee nʼụbọchị niile nke ndụ ya.
6 Fez o mal aos olhos do Senhor, não lhe foi inteiramente fiel como o fora seu pai Davi.
7 Nʼelu ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem, Solomọn wuru ebe dị elu nye Kemosh, chi rụrụ arụ nke ndị Moab, wuokwara Molek chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.
7 Por esse tempo edificou Salomão no monte, que está a oriente de Jerusalém, um lugar alto a Camos, deus de Moab, e a Moloc, abominação dos amonitas.
8 O mekwara otu ihe ahụ nye ndị nwunye ya niile si mba ọzọ, bụ ndị na-achụ aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ, na-achụkwa aja nsure ọkụ dị iche iche nye chi niile ha.
8 E o mesmo fez para todas as suas mulheres estrangeiras, que queimavam incenso e sacrificavam aos seus deuses.
9 Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide Solomọn, nʼihi na obi ya esitela nʼebe Onyenwe anyị Chineke Izrel nọ pụọ, bụ onye mere ka ọ hụ ya anya ugboro abụọ.
9 O Senhor irritou-se contra Salomão, por se ter seu coração desviado do Senhor, Deus de Israel, que lhe aparecera por duas vezes,
10 Ọ bụ ezie na o nyere Solomọn iwu ka ọ ghara ịgbaso chi ndị ọzọ, ma Solomọn erubeghị isi nʼiwu a Onyenwe anyị nyere.
10 e lhe tinha proibido expressamente que se unisse a deuses estranhos. Mas não seguira as ordens do Senhor.
11 Ya mere, Onyenwe anyị gwara Solomọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, jụ idebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ m, nke m nyere gị idebe, aghaghị m isite nʼaka gị dọkapụ alaeze a, were ya nye otu nʼime ndị na-ejere gị ozi.
11 O Senhor disse-lhe então: Já que procedeste assim, e não guardaste a minha aliança, nem as leis que te prescrevi, vou tirar-te o reino e dá-lo ao teu servo.
12 Ma nʼihi nna gị Devid agaghị m eme ihe ndị a mgbe ị dị ndụ. Aga m anapụ nwa gị nwoke alaeze Izrel.
12 Todavia, em atenção ao teu pai Davi, não o farei durante a tua vida. Tirá-lo-ei, sim, mas da mão de teu filho.
13 Ma agaghị m anapụcha ya alaeze Izrel niile, kama aga m eme ka ọ bụrụ eze otu ebo Izrel, nʼihi Devid, na nʼihi Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m.”
13 Não lhe tirarei o reino todo, mas deixarei ao teu filho uma tribo, por amor de meu servo Davi, e por amor de Jerusalém, a cidade que escolhi.
14 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mere ka onye iro bilie megide Solomọn. Onye a bụ Hadad onye Edọm, onye sikwa nʼezinaụlọ ndị eze Edọm.
14 O Senhor suscitou um inimigo a Salomão: Hadad, o edomita, da linhagem real de Edom.
15 Nʼoge gara aga, mgbe Devid na-ebuso ndị Edọm agha, Joab, onyeisi ndị agha, onye gara ili ndị agha e gburu egbu, tigburu ndị ikom niile nọ nʼEdọm.
15 No tempo em que Davi estava em guerra contra Edom, quando Joab, general do exército, foi sepultar os mortos e matou todos os varões de Edom
16 Joab na ndị agha Izrel niile nọgidere nʼebe ahụ ọnwa isii, tutu ruo mgbe ha gbuchapụrụ ndị ikom niile nọ nʼEdọm.
16 {Joab, com efeito, demorou-se ali seis meses com todo o Israel, até exterminar todos os varões de Edom.}
17 Ma Hadad, onye bụ nwantakịrị nʼoge ahụ, gbapụrụ ọsọ gbaga Ijipt, ya na ụfọdụ ndịisi ọchịchị Edọm, ndị jeere nna ya ozi.
17 Hadad fugiu com os edomitas, servos de seu pai, na direção do Egito.
18 Ha sitere nʼala Midia gaa Paran. Site na Paran, ha duuru ụfọdụ ndị mmadụ, ndị sooro ha gaa Ijipt, jekwuru Fero eze Ijipt, onye nyere Hadad ụlọ obibi na ala, nyekwa ya ihe oriri.
18 Hadad era então muito criança. Partiram de Madiã e foram a Farã; dali, levando consigo homens de Farã, entraram no Egito e foram ter com o faraó, rei do Egito. Este deu-lhes casa, proveu ao seu sustento e doou-lhes terras.
19 Hadad hụtara amara nʼihu Fero, nke mere na ọ kpọnyere ya nwanne nwanyị Tapenes bụ nwunye eze ka ọ bụrụ nwunye ya.
19 Hadad ganhou a simpatia do faraó, que lhe deu por mulher sua cunhada, irmã da rainha Tafnes.
20 Nwanne Tapenes mụtara ya nwa nwoke aha ya bụ Genubat, onye Tapenes zụlitere nʼụlọeze. Genubat biri nʼetiti ụmụ Fero.
20 Desta irmã de Tafnes teve Hadad um filho, Genubat, que Tafnes criou na casa do faraó. E Genubat habitou no palácio com os filhos do faraó.
21 Mgbe Hadad nọ nʼIjipt, ọ nụrụ na Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ na Joab ọchịagha ndị agha anwụọkwala, ọ rịọrọ Fero arịrịọ ka o kwenye ka ọ laghachi nʼEdọm.
21 Quando Hadad ouviu dizer, no Egito, que Davi adormecera com seus pais, e que Joab, general do exército, estava morto, disse ao faraó: Deixa-me voltar para a minha terra.
22 Fero jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji chọọ ịla? O nwere ihe ị chọrọ nke ị na-adịghị enweta nʼebe a?”
22 O faraó respondeu-lhe: Falta-te algo em minha casa, para que queiras voltar para a tua terra? Nada me falta, respondeu; mas deixa-me partir assim mesmo. Hadad voltou, pois, para a sua terra. E eis o mal que fez: tornou-se rei de Edom e tratou Israel como inimigo.
23 Nwoke ọzọ Chineke mere ka ọ bụrụ onye iro Solomọn bụ Rezon nwa Eliada, onye gbapụrụ site nʼaka nna ya ukwu bụ Hadadeza, eze Zoba.
23 Deus suscitou outro inimigo a Salomão: Razon, filho de Eliada, que fugira de seu senhor Hadadezer, rei de Soba.
24 Devid lara ndị agha Zoba nʼiyi, Rezon chịkọtara ndị ikom gbara ya gburugburu, ghọọ onyendu ha, ndị nnupu isi a gara Damaskọs biri nʼebe ahụ, na-achịkwa nʼebe ahụ.
24 Após os massacres de Davi, juntara homens em torno de si, tornando-se chefe de quadrilha. Atacaram Damasco, onde se estabeleceram, e constituíram-no rei em Damasco.
25 Ogologo ụbọchị niile nke ndụ Solomọn, Rezon bụ onye iro Izrel, tinyekwara nsogbu nke Hadad wetaara Izrel. Rezon bụ eze ndị Aram, bụrụkwa onye na-emegide Izrel.
25 Foi inimigo de Israel durante toda a vida de Salomão.
26 Jeroboam nwa Nebat, onye Ifrem nke Zereda, otu nʼime ndị ozi Solomọn, biliri megide eze. Nne ya bụ Zerua, nwanyị di ya nwụrụ anwụ.
26 Também Jeroboão, filho de Nabat, efrateu de Sareda {filho de uma viúva chamada Sarva}, que estava a serviço de Salomão, revoltou-se contra o rei.
27 Nke a bụ akụkọ banyere otu o siri bilie imegide eze: Solomọn wugharịrị Milo, wuziekwa ntipu dị na mgbidi obodo Devid bụ nna ya.
27 Eis em que circunstâncias ele se revoltou contra o rei: Salomão construía Milo para fechar a brecha da cidade de Davi, seu pai.
28 Ugbu a Jeroboam, nʼonwe ya, bụ dimkpa. Mgbe Solomọn hụrụ otu nwokorobịa a si arụzi ọrụ ya nke ọma, o mere ya onye nlekọta ndị ọrụ niile si nʼezinaụlọ Josef.
28 Ora, Jeroboão era um jovem enérgico, e Salomão, vendo-o tão laborioso, confiou-lhe a superintendência de todos os trabalhadores da casa de José.
29 Ma otu ụbọchị, mgbe Jeroboam si Jerusalem na-apụ, o zutere Ahija onye amụma, onye Shilo, nʼụzọ, ebe o yi uwe ọhụrụ. Ọ bụkwa naanị ha abụọ nọ nʼọhịa mgbe ahụ.
29 E aconteceu que um dia, saindo Jeroboão de Jerusalém, encontrou-se em caminho com o profeta Aías de Silo, vestido com um manto novo. Estavam os dois sós no campo.
30 Mgbe ahụ, Ahija yipụrụ uwe ọhụrụ nke o yi nʼahụ dọwasịa ya ụzọ iri na abụọ.
30 Então Aías, tomando o manto novo que trazia, rasgou-o em doze pedaços.
31 Mgbe ahụ, ọ gwara Jeroboam sị, “Chịrị iberibe iri nye onwe gị, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Lee, aga m anapụ Solomọn alaeze a, ma aga m enyekwa gị ebo iri nʼime ha.
31 Toma para ti dez pedaços, disse ele a Jeroboão, pois isto diz o Senhor, Deus de Israel: Vou arrancar o reino das mãos de Salomão, e dar-te-ei dez tribos.
32 Ma aga m ahapụrụ ya otu ebo, nʼihi ohu m Devid na nʼihi Jerusalem obodo m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel.
32 Mas, em atenção ao meu servo Davi e à cidade de Jerusalém, que escolhi dentre todas as tribos de Israel, ficar-lhe-á ainda uma tribo.
33 Nʼihi na ha ahapụla m malite ịkpọ isiala nye Ashtọret, chi nwanyị ndị Saịdọn; na nyekwa Kemosh, chi ndị Moab; na nye Molek, chi ụmụ Amọn. Ha agbasoghị ụzọ m, ha emekwaghị ihe ndị ahụ m gụrụ dịka ezi ihe. Ha edebeghị iwu m na ụkpụrụ m niile dịka Devid nna Solomọn mere.
33 Abandonaram-me, prostraram-se diante de Astarte, deusa dos sidônios, diante de Camos, deus de Moab e diante de Melcom, deus dos amonitas. Não andaram em meus caminhos, para fazer o que é bom diante de meus olhos e observar minhas leis e ordens, como o fez Davi, pai de Salomão.
34 “ ‘Ma agaghị m anapụ alaeze ya ugbu a, nʼihi ohu m Devid, onye m họpụtara, na onye mere ihe tọrọ m ụtọ. Aga m ahapụ Solomọn ka ọ nọgide dịka eze ụbọchị ndụ ya niile.
34 Contudo, não lhe tirarei todo o reino, mas deixá-lo-ei governar todos os dias de sua vida, por amor de meu servo Davi, a quem escolhi, o qual guardou os meus mandamentos e os meus preceitos.
35 Ma aga m anapụ alaeze ya site nʼaka nwa ya, nye gị ebo iri.
35 Tirarei, porém, o reino das mãos do filho de Salomão, para dar-te dez tribos.
36 Nwa ya ka m ga-enye otu ebo, nʼihi na achọrọ m ka Devid ohu m nọgide ịbụ eze Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m, ebe m mere ka Aha m dịrị.
36 Deixarei uma tribo ao seu filho, para que meu servo Davi tenha sempre uma lâmpada diante de mim em Jerusalém, cidade que escolhi para estabelecer nela o meu nome.
37 Ma otu ọ dị, gị ka m ga-ewere. Ị ga-abụkwa onye ga-achị ebe ahụ niile obi gị chọrọ; i ga-abụ eze Izrel.
37 Tomo-te, pois, para reinares sobre tudo o que possas desejar. Serás rei de Israel.
38 Ọ bụrụ na i gee ntị mee ihe niile m ga-enye gị nʼiwu, jekwa ije nʼirubere m isi, mee ihe ziri ezi nʼanya m, site nʼidebe ụkpụrụ niile na iwu niile, dịka ohu m Devid mere, aga m anọnyere gị. Aga m ewuru gị ụlọ ga-adịgide dịka m siri wuoro Devid. Aga m enyekwa gị Izrel.
38 E se obedeceres a todas as minhas ordens, se andares pelos meus caminhos, se fizeres o bem diante de mim, observando os meus preceitos e os meus mandamentos, como fez meu servo Davi, eu estarei contigo. Edificar-te-ei uma casa estável, como edifiquei para Davi, e te entregarei Israel.
39 Aga m eweda agbụrụ Devid nʼihi ihe a, ma ha agaghị abụ ndị e wedara nʼala ruo ebighị ebi.’ ”
39 Humilharei assim a descendência de Davi, mas não para sempre.
40 Solomọn gbalịrị igbu Jeroboam, ma Jeroboam gbaara ọsọ gbakwuru eze Shishak nke Ijipt. Ọ nọkwara nʼIjipt ruo mgbe Solomọn nwụrụ.
40 Salomão procurou matar Jeroboão, mas este fugiu para junto do rei Sesac, no Egito, onde permaneceu até a morte de Salomão.
41 Ma banyere ihe ndị ọzọ mere nʼoge ọchịchị Solomọn, nke bụ, ihe niile o mere na amamihe o gosipụtara, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Solomọn?
41 O resto da história de Salomão, todos os seus atos, a sua sabedoria, tudo está escrito no livro dos Atos de Salomão.
42 Solomọn chịrị Izrel niile iri afọ anọ na Jerusalem.
42 Salomão reinou sobre todo o Israel durante quarenta anos, em Jerusalém.
43 O sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid bụ nna ya. Rehoboam nwa ya, ghọkwara eze nʼọnọdụ nna ya.
43 Depois adormeceu com seus pais e foi enterrado na cidade de seu pai Davi. Roboão, seu filho, tornou-se rei em seu lugar.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Reis 11, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.