1 Reis 10

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVI

Sair da comparação
NVI Nova Versão Internacional
1 Mgbe eze nwanyị Sheba nụrụ akụkọ Solomọn, na ịdị na mma nke dị nʼetiti ya na Onyenwe anyị, ọ bịara ka o were ọtụtụ ajụjụ siri ike nwalee Solomọn.
1 A rainha de Sabá soube da fama que Salomão tinha alcançado, graças ao nome do Senhor, e foi a Jerusalém para pô-lo à prova com perguntas difíceis.
2 Ọ bịarutere Jerusalem, ya na ọtụtụ ndị ozi nʼebe ha bara ụba, ndị so ya, tinyere ọtụtụ ịnyịnya kamel ndị bu ụda dị iche iche, ọtụtụ ọlaedo na nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche. Ọ bịakwutere Solomọn, ya na ya kparịtara ụka banyere ihe niile nke dị ya nʼobi.
2 Quando chegou, acompanhada de uma enorme caravana, com camelos carregados de especiarias, grande quantidade de ouro e pedras preciosas, foi até Salomão e lhe fez todas as perguntas que tinha em mente.
3 Solomọn zara ya ajụjụ ya niile; ọ dịkwaghị ihe siiri eze ike ịkọwara ya.
3 Salomão respondeu a todas; nenhuma lhe foi tão difícil que não pudesse responder.
4 Mgbe eze nwanyị Sheba hụrụ amamihe niile nke Solomọn, hụkwa ụlọeze o wuru,
4 Vendo toda a sabedoria de Salomão, bem como o palácio que ele havia construído,
5 na ihe oriri a na-adọkwasị nʼelu tebul ya, usoro ọnọdụ nke ndịisi ọchịchị ya, na ndị guzo na-ejere ya ozi nʼuwe ha yi, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ ya, na aja nsure ọkụ niile ọ na-achụ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, ọ dịkwaghị ihe ọzọ ọ maara ọ ga-eme, maọbụ kwuo.
5 o que era servido em sua mesa, o lugar de seus oficiais, os criados e copeiros, todos uniformizados, e os holocaustos que ele fazia no templo do Senhor, ela ficou impressionada.
6 Ọ sịrị eze, “Akụkọ niile m nọ nʼala m nụ banyere ihe niile ị rụpụtara na amamihe gị bụ eziokwu.
6 Disse ela então ao rei: "Tudo o que ouvi em meu país acerca de tuas realizações e de tua sabedoria era verdade.
7 Ma ekwenyeghị m akụkọ ndị a tutu ruo mgbe m bịara jiri anya m abụọ hụ ha. Nʼezie, ihe m nụrụ erughị ọkara; nʼamamihe nakwa nʼịba ụba gị, ị tụkwasịla ihe nʼakụkọ m nụrụ.
7 Mas eu não acreditava no que diziam, até ver com os meus próprios olhos. Na realidade, não me contaram nem a metade; tu ultrapassas em muito o que ouvi, tanto em sabedoria como em riqueza.
8 Lee, ụdị ọṅụ ndị gị na-enwe. Lee, ụdị ọṅụ nke ndị ozi na-enwe, bụ ndị na-eguzo nʼihu gị mgbe niile na-anụ okwu amamihe gị.
8 Como devem ser felizes os homens da tua corte, que continuamente estão diante de ti e ouvem a tua sabedoria!
9 Ngọzị dịrị Onyenwe anyị Chineke gị, onye nwere mmasị nʼebe ị nọ, o debere gị nʼocheeze Izrel. Nʼihi ịhụnanya nke Onyenwe anyị na-adị ruo mgbe ebighị ebi nʼebe Izrel nọ, o meele gị eze, ka ị debe ikpe ziri ezi na ezi omume.”
9 Bendito seja o Senhor, o teu Deus, que se agradou de ti e te colocou no trono de Israel. Por causa do amor eterno do Senhor para com Israel, ele te fez rei, para manter a justiça e a retidão".
10 O nyere Solomọn onyinye ọlaedo ịdị arọ ya dị puku kilogram anọ, nyekwa ya ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ dị iche iche, na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa. O nwebeghị oge ọzọ ewebatara ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ dịka ndị ahụ eze nwanyị Sheba nyere eze Solomọn.
10 E ela deu ao rei quatro toneladas e duzentos quilos de ouro e grande quantidade de especiarias e pedras preciosas. E nunca mais foram trazidas tantas especiarias quanto as que a rainha de Sabá deu ao rei Salomão.
11 (Ọzọkwa, ọtụtụ ụgbọ mmiri nke eze Hiram bubatara ọlaedo site nʼỌfịa bulatara Solomọn. Ha sitekwara nʼebe ahụ bute osisi almụg nʼebe ọ bara ụba, na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche.
11 ( Os navios de Hirão, que carregavam ouro de Ofir, também trouxeram de lá grande quantidade de madeira de junípero e pedras preciosas.
12 Eze ji osisi almụg ndị a wuo ogidi ndabere dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị na nke ụlọeze. O jikwa ya meere ndị na-abụ abụ ụbọ akwara na une. Ọ dịbeghị mgbe ọbụla ahụrụ maọbụ tụbata osisi almụg ha otu a site nʼụbọchị ahụ ruo taa.)
12 O rei utilizou a madeira para fazer a escadaria do templo do Senhor e a do palácio real, além de harpas e liras para os músicos. Nunca mais foi importada nem se viu tanta madeira de junípero. )
13 Eze Solomọn nyekwara eze nwanyị Sheba ihe niile ọ chọrọ na ihe niile bụ nke ọ rịọrọ, na-agụnyeghị onyinye niile Solomọn nyere ya dịka eze ọ bụ. Emesịa, ọ hapụrụ laghachi nʼala nke aka ya, ya na ndị na-ejere ya ozi.
13 O rei Salomão deu à rainha de Sabá tudo o que ela desejou e pediu, além do que já lhe tinha dado por sua generosidade real. Então ela e os seus servos voltaram para o seu país.
14 Ọtụtụ ịdị arọ nke ọlaedo Solomọn na-enweta kwa afọ bụ puku kilogram iri abụọ na atọ,
14 O peso do ouro que Salomão recebia anualmente era de vinte e três toneladas e trezentos quilos,
15 na-agụnyeghị uru nke na-esi nʼaka ndị na-atụ mgbereahịa na ndị na-azụ ahịa na nke sitekwara nʼaka ndị eze Arebịa niile, nakwa nʼaka ndịisi na-achị obodo niile nke ala ahụ.
15 fora os impostos pagos por mercadores e comerciantes e por todos os reis da Arábia e pelos governadores do país.
16 Eze Solomọn kpụrụ narị ọta ọlaedo ukwu abụọ site nʼọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru kilogram isii na ụma itoolu ka eji kpụọ ọta ọbụla.
16 O rei Salomão fez duzentos escudos grandes de ouro batido, utilizando três quilos e seiscentos gramas de ouro em cada um.
17 Ọ kpụkwara narị ọta nta atọ, nke sitere na ọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram atọ na ọkara ka eji kpụọ ọta ọbụla. Eze debere ha nʼụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn.
17 Também fez trezentos escudos pequenos de ouro batido, com um quilo e oitocentos gramas de ouro em cada um. O rei os colocou no Palácio da Floresta do Líbano.
18 Eze mekwara ocheeze dị ukwu nke e ji ọdụ enyi na ọlaedo a nụchara anụcha machie.
18 O rei mandou fazer ainda um grande trono de marfim revestido de ouro puro.
19 Ocheeze ahụ nwere ihe nrigo isii, o nwere elu dị gburugburu nʼazụ ya. E nwere ebe ntụkwasị aka nʼakụkụ abụọ ya, nke nwere oyiyi ọdụm abụọ guzo nʼakụkụ nke ọbụla nʼime ha.
19 O trono tinha seis degraus, e o seu encosto tinha a parte alta arredondada. Nos dois lados do assento havia braços, com um leão junto a cada braço.
20 Ọdụm iri na abụọ na-eguzo nʼelu ihe nrigo isii ahụ, otu nʼakụkụ isi abụọ nke ihe nrigo ọbụla. Ọ dịkwaghị alaeze ọzọ dị nke e mere ihe dị otu a nye.
20 Doze leões ficavam nos seis degraus, um de cada lado. Nada igual havia sido feito em nenhum outro reino.
21 Ihe niile Solomọn nwere nke e ji aṅụ ihe bụ ọlaedo ka e ji mee ha. Ngwongwo niile nke dị nʼime ụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji kpụọ ha. Ọ dịghị ihe e ji ọlaọcha kpụọ, nʼihi na-agụnyeghị ọlaọcha dịka ihe ọbụla nʼoge Solomọn.
21 Todas as taças do rei Salomão eram de ouro, bem como todos os utensílios do Palácio da Floresta do Líbano. Não havia nada de prata, pois a prata quase não tinha valor nos dias de Salomão.
22 Eze nwere ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa nʼoke osimiri, tinyere ụgbọ nke Hiram. Otu ugbo nʼafọ atọ, ka ụgbọ mmiri ndị a na-alọta, buru ọlaedo, ọlaọcha na ọdụ enyi, enwe na adaka dị iche iche bata.
22 O rei tinha no mar uma frota de navios mercantes junto com os navios de Hirão. Cada três anos a frota voltava, trazendo ouro, prata, marfim, macacos e pavões.
23 Eze Solomọn bara ụba nʼakụ, nwekwa amamihe karịa ndị eze niile dị nʼụwa.
23 O rei Salomão era o mais rico e o mais sábio de todos os reis da terra.
24 Ụwa niile na-abịa ịchọ ihu Solomọn ka ha nụta okwu amamihe nke Chineke tinyere nʼobi ya.
24 Gente de todo o mundo pedia audiência a Salomão para ouvir a sabedoria que Deus lhe tinha dado.
25 Onye ọbụla bịakwutere ya na-ebutere ya onyinye ịnata ihuọma, ya bụ ngwa ọlaọcha na ọlaedo, uwe dị iche iche, ngwa agha, ụda dị iche iche, ịnyịnya na ịnyịnya muul, nke a bụ kwa afọ, kwa afọ.
25 Ano após ano, todos os que vinham traziam algum presente: utensílios de prata e de ouro, mantos, armas e especiarias, cavalos e mulas.
26 Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ.
26 Salomão juntou carros e cavalos; possuía mil e quatrocentos carros e doze mil cavalos, dos quais mantinha uma parte nas guarnições de algumas cidades e a outra perto dele, em Jerusalém.
27 Eze mere ka ọlaọcha baa ụba dịka nkume efu na Jerusalem. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche.
27 O rei tornou a prata tão comum em Jerusalém quanto as pedras, e o cedro tão numeroso quanto as figueiras bravas da Sefelá.
28 A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ.
28 Os cavalos de Salomão eram importados do Egito e da Cilícia, onde os fornecedores do rei os compravam.
29 Ha sitere nʼIjipt tụbata otu ụgbọ agha nʼọnụ ahịa narị shekel ọlaọcha isii, jirikwa otu narị shekel na iri shekel ise zụta otu ịnyịnya. Ha zipụkwara ha nye ndị eze niile nke ndị Het na ndị Aram.
29 Importavam do Egito um carro por sete quilos e duzentos gramas de prata, e um cavalo por um quilo e oitocentos gramas, e os exportavam para todos os reis dos hititas e dos arameus.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Reis 10, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.