1 Crônicas 29
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVT
1 Mgbe ahụ, Devid gwara ọgbakọ Izrel niile okwu sị ha, “Nwa m Solomọn, onye Chineke họpụtara ịbụ eze nʼọnọdụ m, bụ nwantakịrị na-amachabeghị ihe. Ma ọrụ o nwere ịrụ dị ukwuu, nʼihi na ụlọ ukwu a abụghị mmadụ ka ọ dịrị, kama ọ bụ nye Onyenwe anyị Chineke.
1 O rei Davi se voltou para toda a comunidade e disse: “Meu filho Salomão, que Deus escolheu, ainda é jovem e inexperiente. O trabalho que ele tem pela frente é enorme, pois o templo que ele construirá não será para meros humanos, mas para o S enhor Deus.
2 Ma nʼike m niile, agbalịala m wetachaa ihe niile a ga-eji wuo ụlọnsọ ukwu Chineke m ebe ha dị ukwuu: ọlaedo a ga-eji kpụọ ihe ọlaedo niile, ọlaọcha a ga-eji kpụọ ihe ọlaọcha niile, bronz a ga-eji kpụọ ihe bronz niile, igwe a ga-eji kpụọ ihe igwe niile, na osisi a ga-eji rụọ ihe osisi niile, nkume dị oke ọnụahịa ọniks, a ga-ahịọnye ahịọnye, na nkume dị oke ọnụahịa tọkwọisi, na nkume ndị ọzọ ụcha ha dị iche iche, na nkume ndị ọzọ mara mma, tinyere mabụl.
2 Usando todos os recursos a meu dispor, juntei o que pude para a construção do templo de meu Deus. Agora, há ouro, prata, bronze, ferro e madeira suficientes, bem como grandes quantidades de ônix e outras pedras preciosas, joias caras, todo tipo de pedra da melhor qualidade e mármore.
3 Ugbu a, nʼihi mmasị m nʼebe ụlọnsọ Chineke m dị, ana m enye akụ nke aka m niile, ya bụ ọlaedo na ọlaọcha m, iji ya nye aka, maka iwu ụlọnsọ ukwu Chineke m. Ihe ndị a ka m na-enye, tụkwasịkwa nʼelu ihe ndị ọzọ niile bụ nke m nyerela, nʼihi ụlọnsọ ukwu a:
3 “E agora, por causa de minha alegria com a construção do templo de meu Deus, entrego todos os meus tesouros pessoais, ouro e prata, para ajudar na construção, além de todos os materiais que juntei para o santo templo.
4 bụ puku talenti ọlaedo atọ (ọlaedo e si Ọfịa bubata), na puku talenti ọlaọcha asaa nke a nụchara anụcha, nke a ga-eji machite ahụ ụlọ niile nke ụlọ ndị ahụ.
4 Ofereço 105 toneladas de ouro de Ofir e 245 toneladas de prata refinada para revestir as paredes das construções,
5 Maka ọrụ niile a ga-eji ọlaedo rụọ, na nke a ga-eji ọlaọcha rụọ, na ọrụ niile ndị ǹka ga-arụ. Ugbu a, onye jikeere iwere onwe ya nyechasịa Onyenwe anyị nʼaka taa?”
5 e para os outros trabalhos em ouro e prata a serem feitos pelos artesãos. Quem seguirá meu exemplo e entregará, hoje, ofertas ao S enhor ?”.
6 Mgbe ahụ, ndịisi ezinaụlọ, na ndịisi ozi nke ebo Izrel niile, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi na-elekọta ọrụ eze, jiri obi ha niile nye onyinye.
6 Então os chefes das famílias, os líderes das tribos, os generais e os capitães, e os administradores do rei ofertaram voluntariamente.
7 Ha nyere maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Chineke. Ha nyere puku talenti ọlaedo ise, na puku darik ọlaedo iri, nyekwa puku talenti ọlaọcha iri, na puku talenti bronz iri na asatọ, na narị puku talenti igwe.
7 Para a construção do templo de Deus, entregaram 175 toneladas de ouro, 10.000 peças de ouro, 350 toneladas de prata, 630 toneladas de bronze e 3.500 toneladas de ferro.
8 Ndị niile nwere nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche webatara ya tinye ha nʼụlọakụ dị nʼụlọ nso ukwu Onyenwe anyị, nke Jehiel onye Geshọn na-elekọta.
8 Também contribuíram com pedras preciosas, que foram guardadas no tesouro da casa do S enhor , sob os cuidados de Jeiel, descendente de Gérson.
9 Ndị Izrel niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi otu ndịisi ha jiri wepụta obi nye onyinye, nʼihi na ha ji ọṅụ na obi ha niile nye Onyenwe anyị onyinye. Eze Devid nʼonwe ya ṅụrịkwara ọṅụ nke ukwuu.
9 O povo se alegrou com as ofertas, pois as entregou ao S enhor voluntariamente e de todo o coração, e o rei Davi também se encheu de alegria.
10 Nʼihu ọha Izrel niile, Devid kelere Onyenwe anyị ekele sị,
10 Então Davi louvou o S enhor na presença de toda a comunidade: “Ó S
11 Gị onwe gị, Onyenwe anyị nwe ịdị ukwu, na ike,
11 Ó S enhor , a ti pertencem a grandeza, o poder, a glória, a vitória e a majestade. Tudo que há nos céus e na terra é teu, ó S enhor , e este é teu reino. Tu estás acima de tudo.
12 Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa.
12 Riqueza e honra vêm somente de ti, pois tu governas sobre tudo. Poder e força estão em tuas mãos, e cabe a ti exaltar e dar força.
13 Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-enye gị ekele
13 “Ó nosso Deus, damos graças e louvamos teu nome glorioso!
14 “Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị.
14 Mas quem sou eu, e quem é meu povo, para que pudéssemos te dar alguma coisa? Tudo que temos vem de ti, e demos apenas o que primeiro de ti recebemos!
15 Anyị bụ ndị ọbịa na ndị mbịarambịa nʼihu gị, dịka nna nna anyị ha. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dị ka onyinyo, nke olileanya na-adịghị nʼime ya.
15 Somos estrangeiros e peregrinos na terra, como nossos antepassados antes de nós. Nossos dias na terra são como uma sombra, passam rápido, sem deixar vestígio.
16 O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ihe niile ndị a anyị bukọrọ maka iji rụọra gị ụlọnsọ si nʼaka gị bịa. Ha niile bụkwa nke gị.
16 “Ó S enhor , nosso Deus, até mesmo estes materiais que juntamos para construir um templo em honra ao teu nome santo vêm de ti! Tudo pertence a ti!
17 Amaara m, Chineke m, na ị na-anwale obi, na i na-enwekwa mmasị nʼihe ziri ezi. Ihe ndị niile ka m onwe m nyere site nʼafọ ofufu nakwa obi ziri ezi. Ma ugbu a, ahụla m ọṅụ ndị gị, bụ ndị nọ nʼebe a, ji were afọ ofufu nye gị onyinye ha.
17 Eu sei, meu Deus, que examinas nosso coração e te regozijas quando nele encontras integridade. Tu sabes que fiz tudo isso com boas intenções e vi teu povo entregar ofertas voluntariamente e com alegria.
18 Ya mere, gị Onyenwe anyị, Chineke nna anyị Ebraham na Aịzik, na Izrel, biko, mee ka ụdị ọchịchọ a dịgide nʼime obi ndị gị ruo ebighị ebi, meekwa ka ha jiri obi ha niile gbasoo gị mgbe niile.
18 “Ó S enhor , o Deus de nossos antepassados Abraão, Isaque e Israel, leva teu povo a sempre desejar te obedecer. Mantém o coração deles sempre leal a ti.
19 Nye nwa m Solomọn obi zuruoke nke ọ ga-eji debe iwu gị niile, ọchịchọ gị niile na ụkpụrụ gị niile, ya na mmụọ imezu ihe niile metụtara owuwu ụlọnsọ ukwu a nke m kwadooro ihe niile ndị a.”
19 Dá a meu filho Salomão o desejo sincero de obedecer a todos os teus mandamentos, preceitos e decretos, e de fazer todo o necessário a fim de construir este templo, para o qual realizei estes preparativos”.
20 Mgbe ahụ, Devid gwara ndị Izrel okwu sị, “Toonu Onyenwe anyị Chineke unu!” Ha niile toro Onyenwe anyị Chineke nna ha, kpọọ isiala nye Onyenwe anyị na eze.
20 Então Davi disse a toda a comunidade: “Louvem o S enhor , seu Deus!”. E toda a comunidade louvou o S enhor , o Deus de seus antepassados, e eles se prostraram e se ajoelharam diante do S enhor e do rei.
21 Nʼechi ya, ha wetara otu puku oke ehi, na otu puku ebule, na otu puku ụmụ ebule jiri ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ. Tinyere aja ihe ọṅụṅụ na ọtụtụ aja ndị ọzọ nʼebe ọ bara ụba nʼihi ụmụ Izrel niile.
21 No dia seguinte, trouxeram mil novilhos, mil carneiros e mil cordeiros e os apresentaram ao S enhor como sacrifícios e holocaustos. Também trouxeram ofertas derramadas e muitos outros sacrifícios em favor de todo o Israel.
22 Emesịa, ha jiri ọṅụ rie oriri, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ nʼihu Onyenwe anyị.
22 Naquele dia, festejaram e comeram na presença do S enhor com grande alegria. Mais uma vez, proclamaram Salomão, filho de Davi, como rei. Ungiram Salomão diante do S
23 Ya mere, Solomọn nọkwasịrị nʼocheeze Onyenwe anyị dịka eze, nʼọnọdụ nna ya Devid. Ọ bara ụba nke ukwuu. Ndị Izrel rubekwaara ya isi.
23 Salomão se sentou no trono do S enhor em lugar de seu pai, Davi. Foi bem-sucedido em tudo, e todo o Israel lhe obedecia.
24 Ndịisi ọchịchị niile, na ndịisi Izrel niile, na ụmụ ndị ikom eze Devid niile kwupụtara nrube isi ha nye Solomọn, eze ọhụrụ.
24 Todos os oficiais, os guerreiros e os filhos de Davi prometeram ser leais ao rei Salomão.
25 Onyenwe anyị mere ka Solomọn dị ukwuu hie nne nʼanya ndị Izrel niile. Ọ yikwasịrị ya ebube nke alaeze nʼụdị ọ dịbeghị eze ọbụla buru ya ụzọ chịa nʼIzrel nweturula.
25 O S enhor exaltou Salomão diante de todo o Israel e lhe deu mais esplendor que qualquer outro rei de Israel antes dele.
26 Devid nwa Jesi bụ eze ndị Izrel niile.
26 Davi, filho de Jessé, reinou sobre todo o Israel.
27 Ọ chịrị Izrel iri afọ anọ. Ọ chịrị afọ asaa na Hebrọn, chịakwa iri afọ atọ na atọ na Jerusalem.
27 Reinou em Israel por quarenta anos, sete anos em Hebrom e 33 em Jerusalém.
28 Ọ nwụrụ mgbe ọ ghọrọ ezigbo agadi. Ọ bụkwa onye biri ogologo ndụ, onye nwekwara akụnụba na nsọpụrụ. Solomọn nwa ya nwoke nọchiri ya dịka eze.
28 Morreu em boa velhice, depois de desfrutar uma vida longa, cheia de riqueza e honra. Seu filho Salomão foi seu sucessor.
29 Ihe niile gbasara ọchịchị eze Devid, site na mmalite rụọ nʼọgwụgwụ, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ Samuel, onye ọhụ ụzọ, na nʼakwụkwọ Netan, onye amụma, na nʼakwụkwọ Gad onye ọhụ ụzọ.
29 Todos os acontecimentos do reinado de Davi, do início ao fim, estão escritos no Registro do Vidente Samuel , no Registro do Profeta Natã e no Registro do Vidente Gade ,
30 Akụkọ ndị a gosiri ihe gbasara ọchịchị eze ya, na ịdị ike ya, na ihe niile mere ya, na ihe mere ndị Izrel, na ndị eze ndị mba ọzọ bi ha gburugburu.
30 incluindo os grandes feitos de seu reinado e tudo que aconteceu com ele, com Israel e com todos os reinos vizinhos.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Crônicas 29, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.