1 Crônicas 22
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NTLH
1 Mgbe ahụ, Devid sịrị, “Ebe a ka a ga-ewuru Onyenwe anyị Chineke ụlọ, nakwa ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Izrel.”
1 Então Davi disse: — Neste lugar será construído o Templo de Deus, o
2 Ya mere, Devid nyere iwu ka a kpọkọta ndị ọbịa niile bi nʼIzrel, site nʼetiti ha ọ họpụtara ndị ga-edozi nkume a wara awa nke e ji wuo ụlọ Chineke.
2 Davi mandou que fossem reunidos todos os estrangeiros que moravam em Israel e os pôs para trabalhar. Alguns deles preparavam blocos de pedra para a construção do Templo.
3 Devid wetara ọtụtụ igwe dị ukwuu, nke ha ji akpụta ǹtu maka ibo ọnụ ụzọ ama niile, na nke ịkpụ ihe njikọta niile. O wetakwara bronz a na-apụghị ịkọwa ịdị arọ ya.
3 Davi ajuntou uma grande quantidade de ferro para fazer pregos e braçadeiras para os portões de madeira e ajuntou tanto bronze, que não foi possível pesar.
4 O webatakwara osisi sida nʼapụghị ịgụta ọnụọgụgụ ha, nʼihi na ndị Taịa na Saịdọn butere ha nʼọnụọgụgụ riri nne nye Devid.
4 E o povo de Tiro e de Sidom lhe mandou uma grande quantidade de toras de cedro.
5 Mgbe ahụ, Devid kwuru, “Solomọn nwa m bụ nwantakịrị, onye na-amachabeghị ihe. Ma ụlọnsọ a ga-ewuru Onyenwe anyị ga-abụ ụlọ dị ukwuu, nke ga-enwe aha a ma ama, na nke mara ezi mma nʼanya mba niile dị nʼụwa. Nʼihi ya, aga m akpakọba ihe niile e ji ewu ya.” Ya mere, tupu Devid anwụọ, ọ kwakọtara ngwongwo riri nne.
5 Davi pensou assim: “O templo que o meu filho Salomão vai construir deverá ser esplêndido e famoso no mundo inteiro. Mas ele é jovem e sem experiência; por isso, eu preciso ajuntar o material necessário para a construção.” Por isso, Davi, antes de morrer, ajuntou uma grande quantidade de material.
6 Ọ kpọrọ Solomọn, bụ nwa ya, nye ya iwu iwuru Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel ụlọ.
6 Ele mandou chamar o seu filho Salomão e ordenou que ele construísse um templo para o Senhor , o Deus de Israel.
7 Devid gwara Solomọn sị, “Nwa m, ọ dị m nʼobi iwu ụlọ maka aha Onyenwe anyị bụ Chineke m,
7 Davi disse: — Meu filho, eu quis construir um templo em honra do
8 ma okwu Onyenwe anyị ndị a ruru m ntị sị m, ‘Ị wụsịala ọtụtụ ọbara, bukwaa ọtụtụ agha. Ị gaghị ewu ụlọ nye Aha m, nʼihi na ị wụsịala ọtụtụ ọbara nʼelu ala nʼihu m.
8 Mas ele disse que eu havia matado muita gente e feito muitas guerras. Portanto, por causa de todo o derramamento de sangue que eu causei, ele não me deixaria construir um templo para ele.
9 Ma ị ga-amụta otu nwa nwoke onye ga-abụ mmadụ udo, na onye ga-enwe izuike nʼoge ya. Aga m enye ya izuike site nʼaka ndị iro ya nʼakụkụ niile. Aha ya ga-abụ Solomọn. Aga m enye Izrel udo na ahụ dị jụụ nʼoge ọchịchị ya.
9 Porém Deus me fez uma promessa. Ele disse: “Você terá um filho que governará em paz porque eu farei com que ele viva em paz com todos os seus inimigos. O seu nome será Salomão porque durante o seu reinado eu darei paz e segurança ao povo de Israel.
10 Ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ ahụ. Ọ ga-abụrụ m nwa, mụ onwe m ga-abụkwara ya nna. Aga m emekwa ka ocheeze alaeze ya nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.’
10 Ele construirá um templo para mim. Ele será meu filho, e eu serei seu pai. Os seus descendentes governarão Israel para sempre.”
11 “Ya mere, ugbu a nwa m, ka Onyenwe anyị nọnyere gị mgbe ị ga-ewu ụlọ Onyenwe anyị Chineke gị, dịka o kwuru na ị ga-eme.
11 Davi continuou: — Agora, meu filho, que o
12 Onyenwe anyị nyekwa gị amamihe na nghọta nke ị ga-eji chịa ezi ọchịchị mgbe ị ghọrọ eze Izrel, ka i si otu a debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị.
12 E que o Senhor , seu Deus, lhe dê inteligência e sabedoria para que você possa governar o povo de Israel de acordo com a Lei dele!
13 Mgbe ahụ, ị ga-enwe ọganihu, ma ọ bụrụ na i lezie anya idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị nyere Mosis maka Izrel. Dị ike, nwee obi ike. Atụla ụjọ, maọbụ daa mba.
13 Se você obedecer a todas as leis que o Senhor deu a Moisés para o povo de Israel, tudo irá bem para você. Seja forte e corajoso; não desanime, nem tenha medo.
14 “Ejisiela m ike chịkọtaa ihe maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, narị puku talenti ọlaedo na nde talenti ọlaọcha, na igwe, na bronz, nke a na-apụghị ịgụta ịdị arọ ha, na osisi, na nkume. I nwere ike itinyekwa ihe ndị ọzọ nʼime ha.
14 Quanto ao Templo, com muito esforço eu ajuntei mais de três mil e quatrocentas toneladas de ouro e mais de trinta e quatro mil toneladas de prata para serem usados na construção. Além disso, há uma quantidade tão grande de bronze e ferro, que nem dá para contar. Também armazenei madeira e pedras preparadas, mas você deve arranjar mais.
15 Lee, i nwekwara ọtụtụ ndị ọrụ ndị na-awa nkume, na ndị na-edo nkume, na ndị ọka osisi, na ndị a maara aha ha nʼihe gbasara ǹka nʼọrụ dị iche iche,
15 Para o serviço você tem muitos trabalhadores. Há homens para trabalhar nas pedreiras, e há carpinteiros e pedreiros, e também uma grande quantidade de especialistas em todo tipo de trabalho
16 ọlaedo, na ọlaọcha, na bronz, na igwe, ndị ọrụ nʼenweghị ọnụọgụgụ. Onyenwe anyị aghaghị ịnọnyere gị. Bilie, rụọ ọrụ dịịrị gị.”
16 em ouro, prata, bronze e ferro. Portanto, mãos à obra, e que o Senhor Deus o ajude!
17 Devid nyere ndịisi Izrel iwu ka ha nyere nwa ya Solomọn aka, mgbe ọ ga-ewu ụlọ ahụ.
17 Davi ordenou a todos os líderes de Israel que ajudassem Salomão.
18 Ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ na Onyenwe anyị Chineke anọnyereghị unu? Ọ bụ na o nyebeghị unu udo nʼakụkụ niile? Nʼihi na o nyela m mmeri nʼebe ndị iro m nọ. Ugbu a, ala a dịkwa nʼaka Onyenwe anyị na nʼaka ndị ya.
18 Ele disse: — O
19 Ya mere, tinyenụ obi unu na mmụọ unu nʼịgbaso Onyenwe anyị Chineke unu. Malitekwanụ iwu ụlọnsọ Onyenwe anyị Chineke, ka unu nweekwa ike ibubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na ihe nsọ ndị ọzọ nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a ga-ewu nʼihi Aha Onyenwe anyị.”
19 Portanto, sirvam o Senhor , seu Deus, com todo o coração e alma. Comecem a construir o Templo para que possam colocar nele a arca da aliança do Senhor e os outros objetos usados na sua adoração.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Crônicas 22, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.