1 Crônicas 19

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVI

Sair da comparação
NVI Nova Versão Internacional
1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Nahash eze ndị Amọn nwụrụ, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
1 Algum tempo depois, Naás, rei dos amonitas, morreu, e seu filho foi o seu sucessor.
2 Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere nʼihi na nna ya gosiri m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya.
2 Davi pensou: "Serei bondoso com Hanum, filho de Naás, porque seu pai foi bondoso comigo". Então Davi enviou uma delegação para transmitir a Hanum seu pesar pela morte do pai. Mas, quando os mensageiros de Davi chegaram à terra dos amonitas para expressar condolências a Hanum,
3 ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn, bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na ndị ozi ya abịakwuteghị gị, naanị ka ha mee nledo, nyochapụta otu obodo a dị ma kwatuo ya?”
3 os líderes amonitas lhe disseram: "Achas que Davi está honrando teu pai ao enviar mensageiros para expressar condolências? Não é nada disso! Davi os enviou como espiões para examinar o país e destruí-lo".
4 Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ ha ajị, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha.
4 Então Hanum prendeu os mensageiros de Davi, rapou-lhes a barba, cortou metade de suas roupas até as nádegas, e os mandou embora.
5 Mgbe otu onye bịara zie Devid ihe banyere ndị ikom ahụ, o zipụrụ ndị ozi, ka ha gaa zute ha, nʼihi na e mere ha ihe ihere nʼebe ọ dị ukwuu. Eze sịrị, “Nọdụnụ na Jeriko tutu ruo mgbe afụọnụ unu tolitere, mgbe ahụ unu ga-alọta.”
5 Quando Davi soube disso, enviou mensageiros ao encontro deles, pois haviam sido profundamente humilhados, e lhes mandou dizer: "Fiquem em Jericó até que a barba cresça, e então voltem para casa".
6 Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, Hanọn na ndị Amọn zipụrụ otu puku talenti ọlaọcha iji gbazite ụgbọ agha na ndị na-agba ụgbọ agha site na Aram Naharaim, na Aram Maaka, nakwa Zoba.
6 Vendo Hanum e os amonitas que tinham atraído sobre si o ódio de Davi, alugaram da Mesopotâmia, de Arã Maaca e de Zobá, carros de guerra e condutores de carros, por trinta e cinco toneladas de prata.
7 Ha goro ụgbọ agha ọnụọgụgụ ya dị iri puku atọ, na puku abụọ. Ha gokwara eze Maaka na ndị agha ya, ndị bịara maa ụlọ ikwu agha ha na nso Medeba, ebe ndị Amọn sikwa nʼobodo ha niile chịkọta onwe ha pụta ịlụ agha.
7 Alugaram trinta e dois mil carros e seus condutores, e contrataram o rei de Maaca com suas tropas, o qual veio e acampou perto de Medeba, e os amonitas foram convocados de suas cidades e partiram para a batalha.
8 Mgbe Devid nụrụ nke a, o zipụrụ Joab na ndị agha ya niile bụ dike na dimkpa nʼagha.
8 Ao saber disso, Davi ordenou a Joabe que marchasse com todo o exército.
9 Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama obodo ha. Ma ndị eze ahụ bịara agha, nọpụrụ onwe ha na mbara ala.
9 Os amonitas saíram e se puseram em posição de combate na entrada da cidade, e os reis que tinham vindo posicionaram-se em campo aberto.
10 Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram.
10 Vendo Joabe que estava cercado pelas linhas de combate, escolheu alguns dos melhores soldados de Israel e os posicionou contra os arameus.
11 O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, e zipụrụ ha izute ndị Amọn nʼagha.
11 Pôs o restante dos homens sob o comando de seu irmão Abisai e os posicionou contra os amonitas.
12 Mgbe Abishai na-apụ, Joab gwara ya okwu sị ya, “Ọ bụrụ na ndị Aram esie ike karịa m, mgbe ahụ, ị ga-abịa napụta m. Ọ bụrụkwanụ na ndị Amọn adịrị ike karịa gị, aga m abịa napụta gị.
12 E Joabe disse a Abisai: "Se os arameus forem fortes demais para mim, venha me ajudar; mas, se os amonitas forem fortes demais para você, eu irei ajudá-lo.
13 Nwee obi ike, ka anyị lụọ ọgụ a dịka ndị dị ike, nʼihi ndị anyị na obodo niile nke Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị meekwa ihe dị mma nʼanya ya.”
13 Seja forte e lutemos com bravura pelo nosso povo e pelas cidades do nosso Deus. E que o Senhor faça o que for de sua vontade".
14 Mgbe ahụ, Joab na ndị agha so ya bịara nso ibuso ndị Aram agha, ha sitere nʼihu ha gbapụ ọsọ.
14 Então Joabe e seus soldados avançaram contra os arameus, que fugiram dele.
15 Mgbe ndị Amọn hụrụ ka ndị Aram na-agbapụ ọsọ, ha onwe ha gbakwaara ọsọ nʼihu Abishai, gbaba nʼime obodo. Ya mere, Joab laghachiri na Jerusalem.
15 Quando os amonitas viram que os arameus estavam fugindo de Joabe, também fugiram de seu irmão Abisai e entraram na cidade. Assim, Joabe voltou para Jerusalém.
16 Ma mgbe ndị Aram hụrụ na ndị Izrel tigburu ha, ha zipụrụ ndị ozi gara kpọta ndị Aram site nʼofe ọzọ nke Osimiri Yufretis. Ọ bụ Shofaka ọchịagha ndị agha Hadadeza na-edu ha.
16 Ao perceberem os arameus que haviam sido derrotados por Israel, enviaram mensageiros para trazer arameus que viviam do outro lado do Eufrates, e Sofaque, o comandante do exército de Hadadezer, veio à frente deles.
17 Mgbe a gwara Devid banyere nke a, ọ chịkọtara ndị Izrel niile, pụọ gafee Jọdan. O gara nso imegide ha, o doro usoro agha ya na ncherita ihu ha. Devid doro usoro ndị agha ya izute ndị Aram nʼagha, ha lụsokwara ya agha.
17 Informado disso, Davi reuniu todo o Israel e atravessou o Jordão; avançou contra eles e formou linhas de combate defronte deles. Mas, começado o combate,
18 Ma ha sitere nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ. Devid gburu puku asaa nʼime ndị ikom na-anya ụgbọ agha, gbukwaa iri puku ndị agha anọ ndị na-eji ụkwụ eje. O gbukwara Shofaka, bụ ọchịagha agha ha.
18 eles fugiram de diante de Israel, e Davi matou sete mil dos seus condutores de carros de guerra e quarenta mil dos seus soldados de infantaria. Também matou Sofaque, o comandante do exército deles.
19 Mgbe ndị eze niile nọ nʼokpuru ọchịchị Hadadeza hụrụ na Izrel etigbuola ha, ha mere ka ha na Devid dịrị nʼudo, bụrụkwa ndị nọ nʼokpuru ya.
19 Quando os vassalos de Hadadezer viram que tinham sido derrotados por Israel, fizeram a paz com Davi e se sujeitaram a ele. E os arameus não quiseram mais ajudar os amonitas.

Ler em outra tradução

Comparar com outra

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Crônicas 19, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.