1 Crônicas 12
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NVI
1 Ndị a bụ ndị ikom bịakwutere Devid na Ziklag, mgbe e si nʼihu Sọl nwa Kish chụpụ ya. (Ha so nʼime ndị ọka agha nyeere Devid aka ibu agha.
1 Estes são os que se juntaram a Davi em Ziclague, onde se escondia de Saul, filho de Quis. Eles estavam entre os combatentes que o ajudaram na guerra;
2 Ngwa agha ha bụ ụta, ha nwere ike iji aka nri maọbụ aka ekpe gbapụ àkụ maọbụ fee ebe; ndị a bụ ndị ikwu Sọl si nʼebo Benjamin.)
2 utilizavam arco e flecha e a funda para atirar pedras tanto com a mão direita como com a esquerda; pertenciam à tribo de Benjamim e eram parentes de Saul:
3 Onyeisi ha bụ Ahieza na Joash, bụ ụmụ Shema onye Gibea.
3 Aiezer, o chefe deles, e Joás, filhos de Semaá, de Gibeate; Jeziel e Pelete, filhos de Azmavete; Beraca, Jeú, de Anatote,
4 Ishmaya onye Gibiọn, dimkpa nʼetiti iri mmadụ atọ ndị ahụ, onye bụ onyendu iri mmadụ atọ ahụ,
4 e Ismaías, de Gibeom, um grande guerreiro do pelotão dos trinta, e chefe deles; Jeremias, Jaaziel, Joanã, Jozabade, de Gederate,
5 Eluzai, Jerimot, Bealia, Shemaraya, na Shefataya onye Haruf;
5 Eluzai, Jeremote, Bealías, Semarias e Sefatias, de Harufe;
6 Elkena, Ishaya, Azarel, Joeza na Jashobeam, ndị Kora;
6 os coreítas Elcana, Issias, Azareel, Joezer e Jasobeão;
7 Juela na Zebadaya ụmụ Jeroham onye Gedoa.
7 e Joela e Zebadias, filhos de Jeroão de Gedor.
8 Ndị a bụkwa dike nʼagha sitere nʼebo Gad gbasoo Devid nʼebe e wusiri ike ya dị nʼọzara. Ha bụkwa ndị ọka nʼiji ùbe na ọta alụ agha. Ha dịkwa gara gara dịka ele nʼelu ugwu, ihu ha dịkwa ka ihu ọdụm.
8 Da tribo de Gade alguns aliaram-se a Davi em sua fortaleza no deserto. Eram guerreiros corajosos, prontos para o combate, e sabiam lutar com escudo e com lança. Tinham a bravura de um leão, e eram ágeis como gazelas nos montes.
9 Eza, bụ onyeisi ha.
9 Ézer era o primeiro; Obadias, o segundo; Eliabe, o terceiro;
10 Onye nke anọ bụ Mishmana. Ndị ọzọ nʼusoro ha bụ, Jeremaya,
10 Mismana, o quarto; Jeremias, o quinto;
11 na Atai bụ nke isii, na Eliel bụ nke asaa,
11 Atai, o sexto; Eliel, o sétimo;
12 na Johanan bụ nke asatọ, na Elzabad bụ nke itoolu,
12 Joanã, o oitavo; Elzabade, o nono;
13 na Jeremaya onye nke iri, nakwa Makbanai onye nke iri nʼotu.
13 Jeremias, o décimo; e Macbanai era o décimo primeiro.
14 Ndị a, ndị sitere nʼebo Gad bụ ndịisi agha. Onye na-adịghị ike nʼime ha dị ike dịka narị ndị agha, ma onye dị ike nʼime ha dị ike dịka puku ndị agha.
14 Todos esses de Gade eram chefes de exército; o menor valia por cem, e o maior enfrentava mil.
15 Ọ bụ ha gafere osimiri Jọdan nʼudu mmiri, mgbe Jọdan tofere akụkụ ya niile, chụsaa ndị niile bi na ndagwurugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.
15 Foram eles que atravessaram o Jordão no primeiro mês do ano, quando o rio transborda em todas as suas margens, e puseram em fuga todos os que moravam nos vales, a leste e a oeste.
16 Ndị ọzọ sitekwara nʼebo Benjamin na Juda bịakwute Devid nʼebe ya e wusiri ike.
16 Alguns outros benjamitas e certos homens de Judá também vieram a Davi em sua fortaleza.
17 Mgbe ahụ, Devid pụrụ ịga zute ha, sị ha, “Ọ bụrụ na unu bịara nʼudo inyere m aka, ejikeere m ịnabata unu ka unu dịnyere m. Kama ọ bụrụkwanụ na unu bịara ịrara m nye nʼaka ndị iro m, ebe aka m dị ọcha, ka Chineke nna nna anyị hụ ihe dị unu nʼobi kpee unu ikpe.”
17 Davi saiu ao encontro deles e lhes disse: "Se vocês vieram em paz, para me ajudarem, estou pronto para recebê-los. Mas, se querem trair-me e entregar-me aos meus inimigos quando minhas mãos não cometeram violência, que o Deus de nossos antepassados veja isso e julgue vocês".
18 Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ dakwasịrị Amasai, onyendu iri ndị ikom atọ ahụ, mee ka ọ gwa Devid okwu sị ya,
18 Então o Espírito veio sobre Amasai, chefe do pelotão dos trinta, e ele disse: "Somos teus, ó Davi! Estamos contigo, ó filho de Jessé! Paz, paz seja contigo, e aos teus aliados, pois o teu Deus te ajudará". Davi os recebeu e os nomeou chefes de seus grupos de ataque.
19 Ụfọdụ nʼime ndị ebo Manase gbasooro Devid, mgbe ọ gara sonyere ndị Filistia nʼịlụso Sọl ọgụ. Ma ya na ndị agha ya enyereghị ndị Filistia aka, nʼihi na mgbe ndị Filistia gbachara izu, ndị ndu ndị Filistia zilagara ya. Ha kwuru sị, “Isi anyị ka anyị ga-atụfu ma ọ bụrụ na Devid ahapụ anyị nʼọgbọ agha gbakwuru nna ya ukwu bụ Sọl.”
19 Alguns soldados de Manassés desertaram para Davi quando ele foi com os filisteus guerrear contra Saul. Mas eles não ajudaram os filisteus, porque os seus chefes os aconselharam e os mandaram embora, dizendo: "Pagaremos com a vida, caso Davi deserte e passe para Saul, seu senhor".
20 Mgbe Devid gara Ziklag, ndị a bụ ndị ikom si nʼebo Manase ndị gbasooro ya: Adna, Jozabad, Jediael, Maikel, Jozabad, Elihu na Ziletai. Ndị a niile bụ ndịisi agha na-achị puku ndị agha nʼebo Manase.
20 Estes foram os homens de Manassés que desertaram para Davi quando ele foi a Ziclague: Adna, Jozabade, Jediael, Micael, Jozabade, Eliú e Ziletai, chefes de batalhões de mil em Manassés.
21 Ha nyeere Devid aka imegide ndị agha nkwata ahụ, nʼihi na ha niile bụ dike nʼagha, bụrụkwa ndịisi agha.
21 Eles ajudaram Davi contra grupos de ataque, pois todos eles eram guerreiros valentes, e eram líderes no exército dele.
22 Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọtụtụ ndị ikom na-agbafeta soro Devid, tutu ruo mgbe ha ghọrọ igwe ndị agha, ndị agha nke Chineke.
22 De fato, diariamente chegavam soldados para ajudar Davi, até que seu exército tornou-se tão grande como o exército de Deus.
23 Ndị a bụ ndị jikeere ibu agha, ndị chịkwa ngwa agha bịakwute Devid na Hebrọn, nʼihi na ha chọrọ ka ọ bịa bụrụ eze ha nʼọnọdụ Sọl, dịka Onyenwe anyị kwuru.
23 Este é o número dos soldados armados para a guerra que vieram a Davi em Hebrom para entregar a ele o reino de Saul, conforme o Senhor tinha dito:
24 Ndị sitere nʼebo Juda, ndị bu ọta na ùbe ha dị puku isii na narị asatọ. (6,800)
24 Da tribo de Judá, 6. 800 armados para a guerra, com escudo e lança;
25 Ndị Simiọn a maara aha ha nʼibu agha dị puku asaa na otu narị. (7,100)
25 Da tribo de Simeão, 7. 100 guerreiros prontos para o combate;
26 Ndị Livayị dị puku anọ na narị isii. (4,600),
26 Da tribo de Levi, 4. 600,
27 tinye Jehoiada, onyendu nʼezinaụlọ Erọn na puku ndị ikom atọ na narị asaa (3,700),
27 inclusive Joiada, líder da família de Arão, com 3. 700 homens,
28 na Zadọk, nwokorobịa bụ dike na dimkpa nʼagha, onyendu ndịisi agha iri abụọ na abụọ (22) ndị si nʼezinaụlọ ya.
28 e Zadoque, um jovem e valente guerreiro, com 22 oficiais de sua família;
29 Ụmụ Benjamin, ndị ikwu Sọl, dị puku atọ (3,000), nʼihi na nʼoge a, ọtụtụ ha nọnyeere Sọl.
29 Da tribo de Benjamim, parentes de Saul, 3. 000, a maioria dos quais era até então fiel à família de Saul;
30 Ụmụ Ifrem dị iri puku abụọ na narị asatọ (20,800), ndị dị ike nʼagha, ndị a makwaara aha ha nʼikwu ha.
30 Da tribo de Efraim, 20. 800 soldados valentes, famosos em seus próprios clãs;
31 Site nʼọkara ebo Manase, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ (18,000) ka a họpụtara ịga inyere Devid aka ịbụ eze.
31 Da metade da tribo de Manassés, 18. 000, indicados por nome para fazerem Davi rei;
32 Ụmụ Isaka; narị ndịisi abụọ (200), na ndị ha na-edu. Ndịisi a bụ ndị nwere nghọta oge ha nọ nʼime ya marakwa ihe Izrel kwesiri ime nʼoge ahụ.
32 Da tribo de Issacar, 200 chefes que sabiam como Israel devia agir em qualquer circunstância. Comandavam todos os seus parentes;
33 Ụmụ Zebụlọn dị iri puku ise. (50,000) Ha enweghị obi abụọ ọbụla iso Devid. A zụkwara ha nʼiji ụdị ngwa agha ọbụla na-ebu agha.
33 Da tribo de Zebulom, 50. 000 soldados experientes, preparados para guerrear com qualquer tipo de arma, totalmente decididos a ajudar Davi;
34 Ọnụọgụgụ ndị ndu ụmụ Naftalị dị otu puku (1,000), tinyere ndị agha dị puku iri atọ na asaa (37,000), ndị ji ùbe na ọta.
34 Da tribo de Naftali, 1. 000 líderes com 37. 000 homens armados de escudos e lanças;
35 Ụmụ Dan dị iri puku abụọ na asatọ, na narị isii. (28,600) Ha bụkwa ndị agha jikeere ibu agha.
35 Da tribo de Dã, 28. 600 prontos para o combate;
36 Ụmụ Asha dị iri puku anọ (40,000). Ha bụ ndị ibu agha doro nnọọ anya.
36 Da tribo de Aser, 40. 000 soldados experientes, preparados para o combate;
37 Sitekwa nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, site nʼebo Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase bi, ndị agha ọnụọgụgụ ha dị narị puku na iri abụọ (120,000), ndị ji ụdị ngwa agha ọbụla pụtara soro Devid. Ha bukwa ngwa agha ha pụta.
37 e do leste do Jordão, das tribos de Rúben e de Gade, e da metade da tribo de Manassés, 120. 000 completamente armados.
38 Ndị a niile bụ ndị agha na-eje ozi nʼusoro ndị ji obi ha pụta.
38 Todos esses eram homens de combate que se apresentaram voluntariamente para servirem nas fileiras. Foram a Hebrom totalmente decididos a fazerem de Davi rei sobre todo o Israel. E todos os outros israelitas tinham esse mesmo propósito.
39 Mgbe ha pụkwutere Devid, ha so ya rie, ṅụọ, abalị atọ. Ọ bụkwa ihe ndị ezinaụlọ ha kwadoro ha ji bịa ka ha riri.
39 Ficaram com Davi três dias, comendo e bebendo, pois as suas famílias haviam fornecido provisões para eles.
40 Ndị Isaka, na Zebụlọn, na Naftalị si ebe dị anya bute nri. Ịnyịnya ibu, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya muul na ehi ka ha ji bute nri ndị a. Ọ bụkwa nri dị iche iche ka ha butere, dịka ụtụ ọka, na achịcha e ji mkpụrụ fiig mee, na achịcha ndị ọzọ dị iche, na mmanya, na mmanụ, na igwe ehi, na igwe atụrụ. Ha si otu a bute nri ndị a nʼihi na oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile.
40 Os habitantes das tribos vizinhas e também de lugares distantes como Issacar, Zebulom e Naftali, trouxeram-lhes muitas provisões em jumentos, camelos, mulas e bois: farinha, bolos de figo, bolos de uvas passas, vinho, azeite, bois e ovelhas, pois havia grande alegria em Israel.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Crônicas 12, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.