1 Crônicas 11
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO) vs NAA
1 Ndị Izrel niile gbakọtara bịakwute Devid na Hebrọn sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ.
1 Então todo o Israel se reuniu com Davi, em Hebrom, dizendo: — Veja, somos do mesmo povo que o senhor, ó rei.
2 Nʼoge gara aga, ọ bụladị mgbe Sọl bụ eze, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. Onyenwe anyị bụ Chineke gị, sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’ ”
2 No passado, quando Saul ainda era o rei, era o senhor quem fazia saídas e entradas militares com Israel. Também o Senhor , seu Deus, lhe disse: “Você apascentará o meu povo de Israel e será príncipe sobre o meu povo de Israel.”
3 Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere eze Devid na Hebrọn, ya na ha gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere ya mmanụ ịbụ eze Izrel, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa site nʼọnụ Samuel.
3 Assim todos os anciãos de Israel foram falar com o rei, em Hebrom. E Davi fez com eles uma aliança em Hebrom, diante do Senhor . E eles ungiram Davi rei sobre Israel, segundo a palavra do Senhor por meio de Samuel.
4 Devid na ndị Izrel zọọrọ ije garuo Jerusalem nke bụ Jebus. Ma ndị Jebus bi nʼebe ahụ,
4 Davi partiu com todo o Israel para Jerusalém, que é Jebus, porque ali estavam os jebuseus que moravam naquela terra.
5 gwara Devid sị, “Ị gaghị abata nʼebe a.” Nʼagbanyeghị okwu ndị a, Devid dọtara ebe ahụ e wusiri ike nke Zayọn nʼagha, ya bụ obodo Devid.
5 Os moradores de Jebus disseram a Davi: — Você não entrará aqui. Porém Davi tomou a fortaleza de Sião, isto é, a Cidade de Davi.
6 Devid ekwuolarị sị, “Onye ọbụla buru ụzọ buo agha megide ndị Jebus ga-abụ onyeisi ọchịagha ndị agha.” Joab nwa Zeruaya bụ onye mbụ gara, nʼihi ya, o nwetara ike ịbụ ọchịagha.
6 Porque Davi disse: — O primeiro a atacar os jebuseus será o chefe e comandante. Então Joabe, filho de Zeruia, atacou em primeiro lugar e foi feito chefe.
7 Devid biiri nʼebe ahụ e wusiri ike. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ya obodo Devid.
7 Assim, Davi morou na fortaleza; por isso ela foi chamada de Cidade de Davi.
8 O wuru obodo gburugburu ya, site na Milo ruo na mgbidi gbara ya gburugburu. Ma Joab wuzikwara akụkụ obodo ahụ nke fọdụrụ.
8 Ele foi edificando a cidade ao redor, desde Milo, completando o circuito; e Joabe renovou o resto da cidade.
9 Ma Devid gara nʼihu na-adị ukwuu karịa, nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nọnyeere ya.
9 Davi ia crescendo em poder cada vez mais, porque o Senhor dos Exércitos estava com ele.
10 Ndị a bụ ndịisi ndị dike nʼetiti ndị agha Devid. Ha na ndị Izrel niile nyere ịchị eze Devid ezi nkwado ime ka ọchịchị ya ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa.
10 São estes os chefes dos valentes de Davi, que o apoiaram valorosamente no seu reino, com todo o Israel, para o fazerem rei, segundo a palavra do Senhor , no que diz respeito a esse povo.
11 Nke a bụ ndekọ ọnụọgụgụ ndị dike nʼagha Devid nwere:
11 Eis a lista dos valentes de Davi: Jasobeão, hacmonita, o principal dos trinta; este brandiu a sua lança contra trezentos homens e os matou de uma só vez.
12 Onye nke na-eso ya bụ Elieza nwa Dodayi, onye Ahohi, onye bụ otu nʼime ndị dike atọ ndị ahụ.
12 Depois dele, Eleazar, filho de Dodô, o aoíta, que era um dos três valentes.
13 Ya na Devid nọ na Pas Damin mgbe ndị Filistia zukọrọ nʼebe ahụ ibu agha. Nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara nʼọka balị, ma ndị agha Izrel si nʼọgbọ agha gbapụ ọsọ nʼihi ndị Filistia.
13 Este estava com Davi em Pas-Damim, quando os filisteus se reuniram ali para a batalha. Havia ali uma plantação de cevada; e o povo fugiu dos filisteus.
14 Ma ha were ọnọdụ ha nʼetiti ubi ahụ, ha napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. Onyenwe anyị nyere mmeri dị ukwuu.
14 Puseram-se no meio daquele terreno, defenderam-no e mataram os filisteus; e o Senhor efetuou grande livramento.
15 Mmadụ atọ nʼime iri ndịisi agha atọ ahụ jekwuru Devid na nkume dị nʼọgba Adulam, na mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim.
15 Três dos trinta chefes desceram à rocha, para falar com Davi na caverna de Adulão; e o exército dos filisteus tinha acampado no vale dos Refains.
16 Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha ndị Filistia dị na Betlehem.
16 Nessa época Davi estava na fortaleza, e a guarnição dos filisteus estava em Belém.
17 Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu, ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!”
17 Davi suspirou e disse: — Quem me dera beber água do poço que está junto ao portão de Belém!
18 Ya mere, ha atọ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala dịka onyinye nye Onyenwe anyị, kwuo sị,
18 Então aqueles três romperam pelo acampamento dos filisteus, tiraram água do poço junto ao portão de Belém e a levaram a Davi. Ele não a quis beber, mas a derramou como libação ao Senhor .
19 “Chineke ekwela ka m mee nke a. M ga-aṅụ ọbara ndị ikom a, bụ ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Nʼihi na ha ji ndụ ha chụọ aja ịga kute ya, Devid ekweghị aṅụ ya.
19 E disse: — Longe de mim, ó meu Deus, fazer tal coisa! Beberia eu o sangue dos homens que lá foram colocando em risco a sua vida? Pois, arriscando a sua vida, a trouxeram. E assim não a quis beber. São estas as coisas que fizeram os três valentes.
20 Abishai, nwanne Joab bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a, ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a.
20 Também Abisai, irmão de Joabe, era chefe de trinta. Este, empunhando a sua lança, atacou trezentos homens e os matou. E tinha nome entre os três.
21 Nʼetiti mmadụ atọ ahụ, a na-asọpụrụ ya karịa, ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha.
21 Ele era mais nobre do que os trinta e se tornou o chefe deles; contudo, não chegou aos primeiros três.
22 Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha, kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya.
22 Também Benaia, filho de Joiada, era homem valente de Cabzeel e realizou grandes feitos. Ele matou dois heróis de Moabe. Desceu numa cova e nela matou um leão no tempo da neve.
23 O tigburu otu nwoke onye Ijipt, nke ogologo ya dị mita abụọ na ọkara. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe buru ezigbo ibu nʼaka, nke okporo ya dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya, pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị ya nʼaka, jiri ya magbuo ya.
23 Matou também um egípcio, homem de dois metros e vinte de altura; o egípcio trazia na mão uma lança como o eixo do tecelão, mas Benaia o atacou com um cajado, arrancou a lança da mão dele e o matou com ela.
24 Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ ahụ.
24 Estas coisas fez Benaia, filho de Joiada, pelo que teve nome entre os primeiros três valentes.
25 A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche.
25 Era mais nobre do que os trinta, porém não chegou aos primeiros três. Davi o pôs sobre a sua guarda.
26 Ndị bụ dike nʼagha bụ ndị a:
26 Os heróis dos exércitos foram: Asael, irmão de Joabe, Elanã, filho de Dodô, de Belém;
27 Shamot onye Haroa,
27 Samote, harorita; Heles, pelonita;
28 Ira nwa Ikesh, onye Tekoa,
28 Ira, filho de Iques, tecoíta; Abiezer, anatotita;
29 Sibekai onye Husha,
29 Sibecai, husatita; Ilai, aoíta;
30 Maharai onye Netofa,
30 Maarai, netofatita; Helede, filho de Baaná, netofatita;
31 Itai nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin,
31 Itai, filho de Ribai, de Gibeá, dos filhos de Benjamim; Benaia, piratonita;
32 Hurai onye si nʼakụkụ iyi dị na Gaash,
32 Hurai, do ribeiro de Gaás; Abiel, arbatita;
33 Azmavet onye Baharum,
33 Azmavete, baarumita; Eliaba, saalbonita;
34 Ụmụ Hashem onye Gizon,
34 Benê-Hasém, gizonita; Jônatas, filho de Sage, hararita;
35 Ahiam nwa Saka, onye Hara,
35 Aião, filho de Sacar, hararita; Elifal, filho de Ur;
36 Hefa onye Mekerat,
36 Héfer, mequeratita; Aías, pelonita;
37 Hezro onye Kamel,
37 Hezro, carmelita; Naarai, filho de Ezbai;
38 Juel nwanne Netan,
38 Joel, irmão de Natã; Mibar, filho de Hagri;
39 Zelek onye Amọn,
39 Zeleque, amonita; Naarai, beerotita, o que carregava as armas de Joabe, filho de Zeruia;
40 Ira onye Itra,
40 Ira, o itrita; Garebe, itrita;
41 Ụraya onye Het,
41 Urias, heteu; Zabade, filho de Alai;
42 Adina nwa Shiza, onye Ruben, onye bụ onyeisi ebo Ruben na iri mmadụ atọ ahụ na-eso ya.
42 Adina, filho de Siza, rubenita, chefe dos rubenitas, e com ele trinta;
43 Hanan nwa Maaka,
43 Hanã, filho de Maaca; Josafá, mitenita;
44 Ụzia onye Ashterat,
44 Uzias, asteratita, Sama e Jeiel, filhos de Hotão, aroerita;
45 Jediael nwa Shimri,
45 Jediael, filho de Sinri, e Joá, seu irmão, tizita;
46 Eliel onye Mahavi,
46 Eliel, maavita, Jeribai e Josavias, filhos de Elnaão; Itma, moabita;
47 Eliel, Obed, na Jaasiel onye Mezoba.
47 Eliel, Obede e Jaasiel, de Zobá.
Atalhos do teclado
- Capítulo anterior←
- Próximo capítulo→
- Versículo anteriork
- Próximo versículoj
- Limpar seleçãoEsc
- Esta ajuda?
Estude este capítulo no WhatsApp
Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Crônicas 11, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.