1 Samuel 3

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ (IBO)

1 Nwata ahụ bụ Samuel nọkwa na-ejere Onyenwe anyị ozi nʼihu Elayị. Nʼụbọchị ndị ahụ okwu Onyenwe anyị dị ụkọ, adịghịkwa ahụ ọtụtụ ọhụ.

2 O ruru nʼotu abalị, ka Elayị dinara ala nʼọnọdụ ya ịrahụ ụra, ebe ọ bụ na anya ya akala nka nke bụ na ọ dịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma.

3 Mgbe ahụ, oriọna Chineke anyụbeghị, Samuel dinara nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼebe ahụkwa ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị.

4 Onyenwe anyị kpọrọ Samuel oku,

5 O biliri jekwuru Elayị, sị ya, “Lee m abịala m.”

6 Ọzọkwa, Onyenwe anyị kpọrọ ya sị, “Samuel!” Samuel gbaara ọsọ jekwuru Elayị sị ya, “Lee m, gịnị ka m ga-eme?”

7 Ma Samuel amatabeghị onye Onyenwe anyị bụ, ekpughebeghị okwu Onyenwe anyị nye ya.

8 Onyenwe anyị kpọrọ ya oku nke ugbo atọ; ọzọkwa Samuel biliri jekwuru Elayị sị ya, “Lee m, gịnị ka ị chọrọ ka m mee?”

9 nʼihi ya ọ gwara Samuel okwu sị, “Laghachi, dinaa ala. Ọ bụrụ na ọ kpọọ gị ọzọ, sị ya, ‘Lee m, kwuo, Onyenwe anyị, nʼihi na ohu gị na-ege ntị.’ ” Ya mere Samuel laghachiri gaa dinaa ala.

10 Onyenwe anyị bịara guzo onwe ya nʼebe ahụ, kpọọ ya ọzọ dịka o si kpọọ ya na mbụ sị, “Samuel! Samuel!”

11 Onyenwe anyị gwara Samuel sị, “Lee, ana m aga ime ihe nʼIzrel nke ga-eme ka ntị nụrụ ya zụọ wuruwuru.

12 Nʼoge ahụ aga m emezu ihe niile m kwuru megide Elayị na ezinaụlọ ya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ.

13 Nʼihi na agwara m ya na m ga-ekpe ezinaụlọ ya ikpe, ruo mgbe ebighị ebi, nʼihi mmehie ahụ ọ maara ihe banyere ya. Nʼihi na ụmụ ya mere onwe ha ndị a na-elelị anya, ma o meghị ihe ọbụla ịkwụsị ha.

14 Ya mere, aṅụọla m iyi nye ụlọ Elayị sị, ‘Ikpe ọmụma dịkwasịrị ụlọ Elayị bụ nke a na-agaghị eji onyinye maọbụ ịchụ aja kpuchie.’ ”

15 Samuel dinara ala tutu ruo ụtụtụ. Mgbe chi bọrọ, o meghere ọnụ ụzọ ụlọ nzute Onyenwe anyị dịka ọ na-eme. Ma egwu tụrụ ya ịgwa Elayị ọhụ ahụ.

16 Ma Elayị kpọrọ ya sị, “Samuel, nwa m.”

17 Elayị jụrụ ya sị, “Gịnị ka ọ gwara gị? Ezola ihe ọbụla nʼebe m nọ. Ka Chineke mesoo gị mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na i zoo ihe ọbụla ọ gwara gị nʼebe m nọ.”

18 Ya mere, Samuel gwara ya ihe niile, o zokwaghị ihe ọbụla. Mgbe ahụ Elayị kwuru okwu sị, “Ya onwe ya bụ Onyenwe anyị, ya meekwa dịka o si dị ya mma nʼanya.”

19 Onyenwe anyị nọnyeere Samuel mgbe ọ na-eto, meekwa ka amụma niile Samuel buru mezuo.

20 Ndị Izrel niile, site na Dan ruo Bịasheba, matara na Samuel bụ onye amụma Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi.

21 Onyenwe anyị gakwara nʼihu na-egosi onwe ya na Shaịlo. Nʼebe ahụ o gosiri onwe ya nye Samuel site nʼokwu ya.

Ler em outra tradução

Comparar lado a lado

Estude este capítulo no WhatsApp

Peça à IA da Bíblia Fala para explicar 1 Samuel 3, comparar traduções ou montar um estudo — tudo direto pelo WhatsApp.